“OSHIOMHOLE LAA!”-NDỊ GỌVANỌ APC NA-AGWA OSHIOMHOLE

Spread the love

Abụja – Ndi Gọvanọ nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) agwala onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n’ala anyị, Adams Oshiomhole ka ọ kpọọ ọgbakọ izugbe otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ (NEC) ma ọ bụ ọ rituo n’ọkwa kwara laa. 

Nkea bụ maka ọgbaghara na-arị ibe ya elu n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ. Ndị Gọvanọ ahụ rụtụrụ aka ná agha na-ada ugbua n’Edo Steeti n’etiti Gọvanọ Steeti ahụ, Gọdwinu Ọbaseki na Oshiomhole n’onwe ya.

APC ngalaba Edo Steeti nọrọ ụbọchị Tuuzdee were nye onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n’ala anyị ọchụchụ nchere oge maka “etu o si ebute ọgbaghara na ngalaba APC nke Steeti ahụ”

Mkpebi natara nkwado nke ndị isi oche APC n’Okpuru Ọchịchị iri n’asatọ dị na steeti ahụ.

N’ozi nke Onye Nlekọta Ukwu nke otu jikọtara ndị Gọvanọ APC a na-akpọ Progressive Governors Forum (PGF), Salihu Moh’d Lukman zigara ndị nta akụkọ ụnyaahụ n’Abụja, otu ahụ jụrụ sị, “Gịnị mere o jighi kwe omume bụ ịkpọ ọgbakọ izugbe otu a iji lebaa anya n’okwu ndị a?

O chetaara Oshiomhole na, dịka Onyeisi oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n’ala anyị na ọrụ ya abụghị sọọsọ na Edo Steeti kama na ọ bụ na Naịjiriya nile.

Ọ dụkwara ya ọdụ ka ọ kpọọ ọgbakọ ukwu otu ahụ, dịka o siri dị n’iwu ha iji lebaa anya na nsogbu nile ji ha ma ọ bụkwanụ ọ rituo n’ọkwa.

“Ọzọkwa bụ akụkọ ọjọọ anyị natara na ụlọikpe achụpụwo Biobarakuma Degi-Eremienyo dịka onye ga-azọ ọkwa Osote Gọvanọ na nhọpụta Gọvanọ a ga-eme na Bayelsa Steeti n’abalị iri n’isii nke ọnwa  Nọvemba.

Ihe a chetakwara anyị udiri amaghị eme ndị isi APC gosipụtara nke mere PDP jiri merie na Zamfara, Rivers, Bauchi nakwa Adamawa Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published.