HMM,MAHADUM UNN GA-EME ỌGBAKỌ AMOSU

Spread the love

Nsụka– A ga-enwe Ọgbakọ maka ịta amosu na mahadum Naịjiriya, Nsụka(UNN) site n’abalị iri abụọ n’isii ruo n’abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Nọvemba afọ 2019.

Ọgbakọ a nke isiokwu ya bụ “Ịta amosu;ihe ọ pụtara, ihe na-ebute ya nakwa ụzọ esi eme ya” tụrụ ndị mmadụ n’anya.

Kedu ihe butere mahadum a ikwado ọgbakọ ndị amosu? Kedụ uru dị n’ọgbakọ a? E nwere ọghọm dị ya?

Ọkammụta Demian Ọpata nakwa Ọkammụta P. J. Eze bụ ndị ga-enye nkuzi n’ọgbakọ ahụ nke ogige ‘Professor B.I.C Ijeoma Center for Policy and Research’ nke mahadum Naịjiriya, Nsụka ga-achịkọta.

Kaosiladi, Ọkammụta Ọpata, otu onye n’ime ndị ga-enye nkuzi ụbọchị ahụ kọwara na o nweghị ihe dị njọ na ilebanye anya n’okwu banyere ịta amosu, iji mee ka ọhaneze mata banyere ya.

“Ụka meziri ndị be anyị a na-atụ egwu ihe nile. Na mba ofesi, ndị mahadum na-amụ banyere ịta amosu nakwa ịgwọ ọgwụ mana oke ụka e meela ka ndị be anyị ghọtahie ihe ndị a nile.

Ọpata kwukwara na mmụta banyere ihe a a na-akpọ amosu ma ọ bụ sayensị ọ gbara Igbo gharị(remote science) nwere uru ọ ga-aba ma ndị mmadụ jiri ha mewe ihe ga-emezi obodo, karịa ịkpa arụ.

O kwuru na ihe ndị ahụ nile bụ onyinye ọnatarachi nke e nwere ike iji mee ihe dị mma maka ọdịmma obodo.

“Isiokwu nkuzi m bụ ‘ndị ọgaranya abụghị amosu’ iji mee ka Ndigbo ghọta na ịta amosu anaghị aba ọgaranya.

” Ndị Ogbenye ka a na-akpọ amosu, ọ bụghị ndị ọgaranya ”

Kaosiladi, ọtụtụ ndị ụka, ọ kacha ndị” Born again ” na-akatọ ọgbakọ ahụ dịka aka ọrụ ndị otu ekwensu. Otu ụkọchukwu gara n’ihu kpọọ ya “aka ọrụ ndị 666 nke na-egosi ụwa mmebi”.

Hmm,ọ ga-adịkwa egwu

Leave a Reply

Your email address will not be published.