ITIBỌRỊBỌ:GỌVANỌ ZAMFARA ACHỤỌLA NDỊ ODEAKWỤKWỌ NLEKỌTA IRI N’ITOLU

Spread the love

Zamfara – Gọvanọ Bello Matawalle nke Zamfara Steeti nọrọ ụbọchị Tọọzdee were chụọ ndị odeakwụkwọ nlekọta (permanent secretaries) Steeti ahụ dị mmadụ iri n’itolu maka na ha dara ule akwụkwọ e nyere ha. 

Matawalle kọwara na ndị nkea metụtara ka a ga-enyezi ọkwa ndị ọzọ dịka onye nlekọta ukwu nke ụlọ ọrụ Gọọmenti dị iche iche.

“Gọọmenti ewetuola ọnụ Ọgụgụ ndị odeakwụkwọ nlekọta site na iri anọ n’isii gbadatazịa na iri abụọ n’asaa” Gọvanọ ahụ kwuru.

Matawalle kwukwara na o keputala mịnịstrị ọhụrụ na-ahụ maka nchekwa.

Ọ gụpụtara ngalaba ọhụrụ o keputakwara dịka nke okwu ala, ịrụ ụlọ nakwa obodo mepere emepe, okwu ndị eze ọdịnala, nlekọta ọdachi  wdg.

O nyekwara ndị Steeti ahụ obisike na ọchịchị ya ga-aga n’ihu na iwelite usoro ọchịchị iji hụ na mee ka ọrụ na aga etu kwesiri ekwesị. 

Leave a Reply

Your email address will not be published.