IWU ABỤGHỊ NA BUHARỊ GA-ENWE ASAMBODO IJI BỤ ONYEISIALA

Spread the love

Abụja – Ụlọikpe mkpedebe Naịjiriya nọrọ taa kwuo na Onyeisiala Buhari tozuru ịbụ Onyeisiala n’agbanyeghị na ọ nyeghị ụlọ ọrụ INEC asambodo ọbụla.

Ụlọikpe a kwuru na o nweghị iwu ọbụla sịrị na mmadụ ga-enye ụlọ ọrụ INEC asambodo ya tupu o tozuo iso zọọ ọkwa ọbụla.

O kwuru nke ka ọ na-akọwa ihe mere o jiri kagbuo akwụkwọ ahụ Alahaji Atiku Abụbaka, onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP were zọọ ọkwa onyeisiala gbara.

O kwukwara na iwu ala Naịjiriya emeghị ka ọ bụrụ iwu na onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ga-enwe asambodo WASC,kama na mmadụ ịgụru akwụkwọ ruo Sekọndịrị n’enweghị asambodo ọbụla ezuola.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na ọ bụghị sọọsọ na Buhari gosiri na o nwere asambodo Sekọndịrị ma rukwaa ọkwa ọchịagha “Major General” n’ọrụ soja, ọ na-ekwunwu okwu na bekee ma nwekwaa asambodo ụlọ akwụkwọ praịmarị, iji mezuo ihe INEC tụrụ anya n’aka ya.

Ọgbakọ mmadụ atọ nke ụlọikpe ahụ kwadokwara mkpebi ụlọikpe nhọpụta Onyeisiala, n’okwu banyere ma Buhari etozuru iso zọọ ọkwa onyeisiala.

Hmm, nsogbu dịkwa. Ya bụ na onye gara ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị n’agafeghị n’ule ọbụla tozuru dịka onye gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị.

Leave a Reply

Your email address will not be published.