ONYE UWE OJII IBE M DINARA NWA M DỊ AFỌ ITOOLU N’IKE

Spread the love

Legọs – Otu nwanyị onye uwe ojii nọrọ ụbọchị Tọọzdee kọọrọ ụlọikpe nọ n’Ikeja etu onye uwe ojii ibe ya, Mohammed Alidu, siri dina nwa ya nwanyị dị afọ itoolu n’ike n’ụsụụ ndị Uwe ojii ebe ha bi.

Ọ sịrị na nwoke a jidere nwa ya nwanyị ka ọ na-alọta akwụkwọ, kpụga n’ụlọ ya ma dina ya n’ike.

“Anyị bi n’ụsụụ ndị Uwe Ojii, Mafoluku, Oshodi, Legọs.

” A nọ m ọrụ n’abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Juun, afọ 2018, oge di m kpọrọ m gwa m na Saajentị Mohammed emerụọla nwa m nwanyị.

“Ka m rutere ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii dị na ya bụ ụsụụ ndị Uwe Ojii ebe anyị bi, nwa m nwanyị  kọọrọ m na ya na-alọta akwụkwọ Mohammed kpọọ ya, ya jụ ịga.

” Ọ sịrị na ọ kpụbara ya n’ụlọ ya n’ike, dọkaa ịba ya ma dinakwa ya n’ike”

Mohammed nọzị na-arịọ ka a gbaghara ya, na ọ bụ ọrụ ekwensu.

Nwanyị ahụ kwukwara na a kpọgara nwa ya nwanyị n’ụlọ ọgwụ Mirabel Centre (ụlọ ọgwụ nnyocha ahụ maka ndị e dinara n’ike) ebe a chọpụtakwara na e dinara nwatakịrị ahụ .

Ọkaikpe Abiola Soladoye bugharịrị ikpe ahụ ka ọ dịzịa n’abalị iri n’ise nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2020.

Leave a Reply

Your email address will not be published.