WỌRỊ: NDỊ UWE OJII EJIRILA EGBE NAPỤ NWATA AKWỤKWỌ EGO ỤGWỌ AKWỤKWỌ YA

Spread the love

Wọrị –  Efe Ifie, nwata akwụkwọ nọ n’agba nke atọ na ngalaba Agumakwụkwọ Nkanụzụ na-ahụ maka ịrụ ụlọ/ụzọ nke Mahadum Delta Steeti, Abraka ka ndị Uwe Ojii si n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Ekpan jiri egbe napụ ego ụgwọ akwụkwọ ya. 

Kaosiladi, ndị uwe ojii kwụsịrị ụgbọala ndị njem bu ya n’ụzọ si Sapele gaa Wọrị ma gwa ya rituo ka ha nyochaa ya.

“Ka ha ahụghị ihe ọbụla dị njọ n’akpa m, otu onye n’ime ha weere ekwentị m. Oge ọ hụrụ na nwere akara email gmail abụọ, ọ sịrị na m bụ onye yahoo”

“Ha tụrụ m ịga n’aka, kpụrụ m tinye n’ụgbọ ala ha ma gwa onye Ọkwọ ụgbọala ka ọ hapụ m gawa.

Nwokorọbịa ahụ dị iri afọ abụọ n’abụọ kwuru na ha egeghị ntị na nkọwa nile ọ na-enye ha na ya bụ nwata akwụkwọ nke ha ji ekwe ka ọ kpọọ nne na nna ya n’ekwentị. Kama ha na-agwa ya “weta ego ka ha mechie okwu ya”

“Ha si m chọọrọ ha Narị Puku Naira abụọ iji mechi okwu. E tiri m mkpu jụọ ha ebe m ga-esi weta udiri ego ahụ.

Ha ji m ebe ahụ ihe karịrị otu elekere, na-amaja m, na m chọọrọ ha ego ebe ahụ ma ọ bụ ha akpọga m ụlọ ọrụ ha. Aha ha anọghịkwa n’uwe ha”

Efe sị na ha hụzịrị ozi ụlọ akụ nke Narị Puku Naira abụọ ahụ ndị be ha zitere ya were sie ọnwụ iwere ya mana ọ rịọrọ ha na ọ bụ ego ụgwọ akwụkwọ ya.

“Ha duru gaa ATM mana ọ rụghị ọrụ ha edugazie ya ebe e nwere POS n’akụkụ ebe ahụ were jiri egbe manye m iwepụtara ha ego dị otu Narị Puku Naịra n’iri ise.

“Ha kpọkwa m gaghachi n’ụlọ ọrụ ha, bunye m akpa m were tọhapụ m”

O kwuru na ọ maghị aha ha ebe ha wepụrụ aha ha n’uwe ha mana ya maara ihu ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, DSP Onome Onovwakpoyeya, sị na ndị Uwe Ojii ahụ agaghị esi n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii dị n’Ekpan maka na ebe ha nọrọ jide Efe anọghị n’okpuru Ekpan.

“O nweghị ihe anyị ga-emenwu n’abụghị ma ọ bịara ụlọ ọrụ anyị nye mkpesa ma kọwara anyị ihe anyị ga-eji mata ndị ahụ. 

Leave a Reply

Your email address will not be published.