ENUGWU :ITURU UGO NA NGOSIPỤTA NKÀ ‘LIFE IN MY CITY’ ABỤGHỊ SITE NA ‘E NYE NDỊ EBE A, E NYE NDỊ EBEA’ (QUOTA) – ICHIE K. U. KALỤ

Spread the love

Enugwu – E jiri mmemme mgbede pụrụ iche mere mechie Ngosipụta Nkà ‘Life in My City’ nke afọ 2019 n’ụlọ ezumezu Mahadum IMT, Enugwu n’abalị Satọdee, abalị iri n’isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2019.

N’okwu ya, Ichie Kalụ Uke Kalụ, Onyeisi Oche Otu Mgbazi (Board of Trustees), Life in My City Arts Festival (LIMCAF) ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka Onyeisi Oche  otu mgbazi( Board Chairman), Ụlọakụ Union Bank mere ka o doo anya na ndị nka nile ahọtara tuuru ugo bụ site n’ụzọ ziri ezi, na ịma mmadụ adịghị ya.

“Ndị nile ahọtara bụ site n’ụzọ ziri ezi, ọ bụghị site na ịma mmadụ ma ọ bụ ‘e nye ndị ebea, e nye ndị ebea’ (quota).

“Mmadụ isii ndị mbụ nile ga-enweta ohere ịga ngosipụta nka a na-eme na Dakar mba Senegal, afọ 2020 a na-akpọ Dak’art n’efu nke Ọkammụta El Anatsui ga-akwụrụ ha ụgwọ ya”

N’okwu nke ya, aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyị kelere ndị chịkọbara ya bụ mmemme maka mbọ ha na-agba ịkwalite nkà

“A na m ekele ndị chikọbara mmemme a maka mbọ ha na-agba ịkwalite nkà n’etiti ndị ntorobịa. Daalụnụ maka ibute mmemme a n’Enugwu Steeti. Enugwu Steeti ga-agakwa n’ihu na-akwado mmemme a”

Ugwuanyị kpọkwara oku ka e nwee otu ga-ejikọta nile sonyeworo n’asọmmpi nkà ahụ (alumni association) iji na-aga n’ihu n’ịgbaziri ha etu kwesịrị ekwesị.

Ọkammụta Bruce Onobrakpeya, otu onye nwere agba n’okwu nkà n’ala anyị kwuru na mmemme ahụ nke na-akpọkọta ndị ntorobịa ruru otu narị si akụkụ Naịjiriya nile na – enyekwa n’iweta ịdịnotu ala anyị.

N’okwu ya, Obi Ọnịcha, Igwe Nnaemeka Achebe bụ onye so akwado ya bụ mmemme kelere Gọvanọ Enugwu Steeti, Ifeanyịchukwu Ugwuanyị nke ukwuu maka iwepụta ohere were bịa ya bụ mmemme.

Obi Ọnịcha rịọrọ ka Gọvanọ ahụ welitekwuo nkwado ya iji mee ka Enugwu Steeti bụrụ “okwu a kpụ n’ọnụ” maka nkà.

O kelekwara ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi MTN nakwa ụlọakụ First Bank maka iji ego kwado ya bụ mmemme.

Obi Achebe kpọkwara oku ka ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ wepụta ọnwa Ọktoba dịka Ọnwa Nkà kwa afọ.

N’asọmmpi nkà nke afọ, e nwere ọgbọ asọmmpi itoolu n’akụkụ ala anyị nile gụnyere; Ondo, Legọs, Enugwu, Pọt Haakọtụ, Zarịya, Ibadan, Bini, Abụja tinyere Ụyọ.

Ichie Rọbọọt Ọjị, onyenwe ụlọ ọrụ mbipụta akwụkwọ ROCANA ma bụrụkwa onye nhiwe, mmemme Life in My City jara mmadụ iri abụọ n’ise ndị mbụ nile bụ ndị a kpọpụtara n’ọgbọ.

Ọ sị ha adala mba maka na ha nile bụ ndị mmeri, n’agbanyeghị na ọ bụ otu onye ga-enweta ọnọdụ nke mbụ.

Viktọ Ọlaoye bụ onye tuuru ugo dịka ọka ibe N’asọmmpi nkà nke afọ a. O nwetara ihe nrite Narị Puku Naịra Iri Ise(N500, 000).

Ndị ọzọ nwere agba bịara mmemme ahụ gụnyere Igwe Lọrịns Agụbụzụ, Onyeisi oche ndị eze ọdịnala n’Enugwu Steeti, Omenka Kris Okoye, Onyeisi Oche Ụlọ ọrụ nkanụzụ Fegno Group, wdg.

Leave a Reply

Your email address will not be published.