NDỊ AKPỤ OBI MERE NHỌPỤTA NA BAYELSA STEETI -MMA ODI

Spread the love

Abụja –  Mma Odi, Odeakwụkwọ ukwu, otu Alliance for Credible Election(ACE) ekwuola hoo!haa! na ndị akpụ obi bụ ndị mere nhọpụta n’ọtụtụ ebe na Bayelsa Steeti.

N’okwu ya, n’ụtụtụ taa bụ Mọnde, abalị iri n’itolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2019 na mmemme ụlọ ọrụ mgbasa ozi AIT a na-akpọ Kaakaki, Odi kwuru na ihe mere na Bayelsa nakwa Kogi abụghị nhọpụta chaa chaa.

“N’Okpuru Ọchịchị Nembe, ndị akpụ obi weghara usoro nile e ji eme nhọpụta. Ndị mmadụ akwụghịdị n’ahịrị chaa chaa. Ndị akpụ obi ji aka ha na-ebinye aka ma na-edekwa ọgbụgba okwe (result) nhọpụta”.

O kwukwara na ụjọ jikwa ndị ọrụ nchekwa ha hụrụ, “Ndị ọrụ nchekwa anyị hụrụ, ezigbo ụjọ ji ha. Ma ndị uwe ojii, ma ndị Civil Defence. Ha na-arịọ anyị tinye ha n’ekpere, na ha achọghị ịnwụ”

Odi kọwakwara na ndị akpụ obi ekweghị ka ndị nnyopu nhọpụta (election observers) na ndị ọrụ nchekwa rute nsọ n’ebe a na-eme nhọpụta.

Ọ kwukwara na INEC boziri aka n’isi maka na ihe ahụ riri ha ọnụ.

N’ajụjụ banyere ka a ga-esi kwụsị ime mpụ nhọpụta, Odi kwuru sị, “Gọọmenti achọbeghị ịkwụsị mpụ nhọpụta. Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya kwesịrị iwepụta iwu ga-eme ka onye akpụ obi ọbụla tisara usoro nhọpụta bụrụ onye aga ama ikpe ọnwụ”

Na nkọwa nke ya, Ọkaiwu Festus Okoye, Onye nlekọta na-ahụ maka mgbasa ozi n’ụlọ ọrụ nhọpụta INEC kọwara na INEC mere ihe ndị ha kwesịrị ime

” Dịka ikike ya si dị, INEC mere ihe nile ọ kwesịrị ime ịhụ na akara ngwa nhọpụta rutere n’ebe a na-eme nhọpụta n’oge. Ọ bụghị ọrụ INEC iweta nchekwa.

Okoye kọwara na INEC enweghị ikike ịkagbu nhọpụta ọbụla, n’abụghị ma onye nlekọta nhọpụta (Presiding Officer) n’ọdụ nhọpụta (pooling booth) ahụ e jiri aka ya kagbuo ya.

“Onye Nlekọta nhọpụta (Presiding Officer) bụ sọ ya nwere ikike ikwu ihe gara n’ọdụ nhọpụta ya”

N’okwu nke ya, Idayat Hassan nke otu Centre for Development and Democracy, onye nke rụrụ ọrụ dịka onye nnyopu nhọpụta na Kogi Steeti na nhọpụta Gọvanọ e mere  a Steeti n’ụbọchị Satọdee gara aga kọkwara ihe anya ya hụrụ

“Ihe e mere abụghị nhọpụta chaa chaa. E ji egbe gbasaa ihe nile. Ọ dị mwute na kemgbe ndị soja pụrụ n’afọ 1999 na Naịjiriya enwebeghi ike ime ihe yiri nhọpụta.

” N’ezie  nhọpụta afọ 1983 kazị nke a  mma. O gosiri na o nweghị agamnihu ọbụla ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.