IKPEAZỤ ADỌTALA $430M MAKA ENYIMBA ECONOMIC CITY

Spread the love

Legọs – Gọvanọ Abịa Steeti, Dọkinta Okezie Ikpeazụ adọtala akatamkpo ego dị nde dọla narị anọ n’iri atọ ($430M) site n’aka ụlọ akụ African Development Bank (AfDB), otu mba ụwa dị iche iche tinyekwara ndị mmadụ ndị kwụụrụ onwe ha iji kwalite atụmatụ Enyimba Economic City (EEC).

EEC bụ obosara ala dị hekta puku itoolu n’ọkara n’etiti Aba na Pọt Haakọtụ, ebe ndị mmadụ ga-ebubata ngwaahịa ma ọ bụkwanụ rụpụta ngwa ahịa n’ọnọdụ akwụghị ụgwọ ịgba ibu(Customs duty)

Ikpeazụ, onye kwuru nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ na Legọs, kọwara na nkea bụ uru sitere n’ọgbakọ ntinye ego azụmahịa mba Afrịka bụ Africa Investment Forum (AIF) e mere na Jọhanesbọg, mba Sawụt Afrịka.

O kwuru na Naịjiriya eritebeghi uru site n’ego na-abịa na ya bụ AIT nke mbụ ya.

Gọvanọ ahụ kọwara na ya bụ atụmatụ EEC ga-ebulite nsonye Naịjiriya na mkpebi nzụkọrịta ahịa mba Afrịka bụ African Continental Free Trade Agreement (AfCFTA), o tokwara Gọọmenti Etiti maka ikwado atụmatụ ahụ ga-eweta ọrụ karịrị narị puku asaa n’ime afọ iri.

N’aka nke ọzọ, Gọvanọ Ikpeazụ akpọkuola Dọkịnta Aleksị Oti, onye jiri ahụ otu ndọrọndọrọ APGA were zọọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ ka ha jikọọ aka ọnụ were kwalite Steeti ahụ.

Ikpeazu kwuru nkea n’Obi Gọọmenti Abịa Steeti, Ụmụahịa ka ọ na-ekwu banyere mmeri ya n’ụlọikpe Mkpegharị n’Owere nke kwadoro nhọpụtagharị ya.

Ikpeazu, n’ozi nke Odeakwụkwọ ukwu mgbasa ozi ya, Onyebuchi Ememanka, wepụtara kpọkuru Oti na ndị otu ya ka ha “mee ka ndi mara ihe, kwanyere ọchịchị obi ọha obodo ugwu ma tinyere ya aka ime ka Steeti ahụ gaa n’ihu”

Ikpeazu hunyere Chineke mmeri ya nke ọ kọwara ka “ihe gosipụtara ikike ọha obodo ndị Abịa Steeti nyere PDP”

Leave a Reply

Your email address will not be published.