KOGI:NDỊ AKPỤ OBI AKPỌỌLA NWANYỊ PDP ỌKỤ

Spread the love

Lokoja – Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ndi akpụ obi nọrọ ụbọchị Mọnde gbaa otu onye isi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP ọkụ n’ime ya n’Ochadamu dị n’Okpuru Ọchịchị Ofu nke Kogi Steeti. 

Ozi si n’aka Mazị Faruk Adejoh-Audu, ọnụ na-ekwuru otu ịchụ nta nkwado PDP kwuru sị, “Oriakụ Acheju Abuh, Onyeisi ụmụ nwanyị n’ógbè Ochadamu ka ndị akpụ obi nọ na-enwe ọṅụ maka mmeri nke Yahaya Bello wakporo be ya.

” Ndị akpụ obi ahụ gụrụ egwu mmeri Yahaya Bello, gbara egbe aghara aghara gbaa ụlọ nwanyị ahụ gburugburu. Ha sunyere ụlọ ahụ ọkụ ma gbakanyere ya egbe ka ọ chọrọ isi na mpio gbapụ”

Nkea mere n’ebe elekere abụọ nke ehihie mana ụjọ ekweghị ndị agbata obi gbatara ya, ọsọ enyemaka. Ndị akpụ obi ahụ ọbara juworo isi nọrọ were hụ na ọkụ gbagbunyụrụ ya anya tupu ha apụọ.

N’agbanyeghị ndị nwụrụ oge a na-eme nhọpụta na Kogi Steeti nke Yahaya Bello merikwara, ọ dị mwute na ịkwafu ọbara nakwa imebi akụnụba ndị mmadụ ka na-agakwa n’ihu.

Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ mmepe obodo dịka Mma Odi nke otu Alliance for Credible Elections(ACE) akpọọla oku ka ntaramahụhụ ga-adịrị ndị akpụ obi tisara usoro nhọpụta bụrụ nkwụgbu.

Nkea dị mkpa maka na iwuala Naịjiriya nwere nkwụgbu dịka ntaramahụhụ dịrị igbu ọchụ.

Ndi Uwe Ojii kwesịrị ịrụkwa ọrụ ha ịhụ na ndị nile mere mpụ dị iche iche na nhọpụta Kogi nakwa Bayelsa Steeti tara ahụhụ dịrị ha, etu iwu siri kwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.