TỤFỊAKWA! NU YỌK E NWEELA ỤLỌ ERIMERI NA-ERE ANỤ MMADỤ

Spread the love

Nu Yọk, Amerịka – Ụlọ erimeri a malitere ọhụrụ n’obodo Nu Yọk, mba Amerịka enwetala ikike n’aka Gọọmenti ịna ere erimeri anụ mmadụ. 

Ụlọ erimeri a aga ya bụ “Skin” natara ikike a ka ha dechara akwụkwọ mkpesa degaara Gọọmenti Etiti na nke Steeti ahụ maka iwu ndị megidere iri anụ mmadụ.

Mario Dorcy, onyenwe ya bụ ụlọ erimeri nwekwara obi ụtọ ịbụ onyenwe ụlọ erimeri mbụ na mba ahụ nwetara ikike ire erimeri anụ mmadụ.

“Dịka ụlọ erimeri,  anyị bụ ndị mbuụzọ n’okwu banyere erimeri  sọọsọ anụ fọziri anyị inweta bụ anụ mmadụ” Dorcy, onye bụ osi ite ọkwa ya dị elu kọwara.

“Anyị gbasiri mgba ike ogologo oge n’ụlọ ikpe ịna ere anụ mmadụ n’ụlọ erimeri anyị, Gọọmenti mechaa kweta na ọchịchọ obi anyị ziri ezi ”

Ọ kọwara na ya busoro iwu megidere iri anụ mmadụ agha ihe karịrị afọ iri, tupu Gọọmenti asị ya gaa n’ihu ka o kwere nkwa na anụ mmadụ ọ ga na-ere ga abụ nke ndị jiri aka ha nyefee ahụ ha n’aka ụlọ erimeri ya ma marakwa na a ga-eri ha eri.

” Anyị ga na-edetu ihe nile nke ọma, e nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị mmadụ ga-etinyecha aka na ha tupu ha anwụọ, maka iri ha eri.

” Anyị na-akwụ ezigbo ụgwọ maka ndị chọrọ inye ahụ ha”

Dorcy kọwara na ha nwere ọtụtụ erimeri ndị ọzọ n’abụghị anụ mmadụ mana na onye ihe ha na-eme adịghị mma abịakwala chaa chaa .

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.