BỊAFRA:OGBUNIGWE AGHA KA DỊ N’AMAWBIA

Spread the love

Ọka – Ogbunigwe e jiri lụọ agha Biafra na-aghaghị agba ka ndị na-arụ ụlọ gbuputara n’obodo nta Adabebe dị n’Amawbia, n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Ọka n’Anambara Steeti.

Ndị ngalaba mwepụ ogbunigwe nke ndị Uwe Ojii bịazịrị bupu ma mebikwaa ya.

Ozi si n’aka Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Haruna Mohammed, kọwara na ọ bụ ụgbọ ngwuala (excavator) e ji egwu ntọala mgbidi ụlọ ọhụrụ gbupụtara ya.

Onye na-anya ya bụ ụgbọ ngwuala, Okechukwu sịrị na mbụ, na ya chere na ogbunigwe ahụ bụ mba ji n’ihi ụdịdị(shape) ya.

Kaosiladi, ogbunigwe ahụ yiri nke ndị Biafra rụrụ site n’ụdịdị ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.