ỌCHỊCHỊ UGBORO ATỌ :A GAGHỊ M ANWA YA ANWA- BUHARỊ

Spread the love

Abụja – Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola hoo!haa! na ya agaghị anwa anwa zọhie ụkwụ site na ịchọ ọchịchị ugboro atọ. 

Buhari kwuru nkea na mmalite ọgbakọ ukwu nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị  All Progressives Congress (APC) na-aga n’ihu ugbua n’Abuja.

Ewezuga nka, Buhari kwukwara na iwuala Naịjiriya nke nyedebere mmadụ ohere ọchịchị ugboro abụọ sọọsọ machibidoro ya ịkọ akụkọ banyere ọchịchị ugboro atọ.

“A gaghị azohie ụkwụ site na ịchọ ọchịchị nke ugboro atọ. Ewezuga nka, iwuala anyị nyere ohere sọọsọ maka ọchịchị ugboro abụọ”, ọ kọwaziri.

Kaosiladi, egwu ka ji ọtụtụ ndị Naịjiriya na Buhari chọrọ ka ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya megharịa iwuala anyị iji nye ya ohere ọchịchị ugboro atọ.

Femi Falana, onye Ọkaiwu nwere agba ma bụrụkwa onye na-akwalite ikike dịịrị mmadụ kwuru hoo!haa! na Onyeisiala Buhari chọrọ ịnọgide n’ọkwa gafee ugboro abụọ bụ ihe iwu ala Naịjiriya mebere site na ime iwu ọchịchị otu ugboro afọ isii.

Falana kwuru na ọ bụ nkea mere Buhari jiri chọọ ka e nwee iwu ga-egbochi ndị ihe ọ na-eme amasịghị ikwu uche ha.

N’otu aka ahụ, Alahaji Buba Galadima bụbu ezi enyi Buhari tupu ha e see okwu ekwuola na ndị “Nze mere na obodo adịghị mma” ga-eduputakwa Buhari ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Nke bụ eziokwu bụ na “ihe akụ ilu na-ada na ntị abụghị ihe ọ na-atọ n’ọnụ”. Ọtụtụ ụmụ amaala Naịjiriya na-ahụtazị Buhari dịka “anụ n’anaghị ebi n’ọnụ ọ tụrụ” maka etu o siri agbanwe okwu ọnụ ya kwa mgbe kwa mgbe.

Ihe ma bụ na “eziokwu ga-emechaa pụta ìhè” ma ọ bụrụkwa Sinetọ Jim Nwobodo, oge ya na Aninefungwu C. C. Onoh na-azọ ọkwa Gọvanọ Anamabra ochie n’afọ 1983.

Leave a Reply

Your email address will not be published.