AKWAMIKO MAHADUM :ACHỤỌLA ỤMỤ AKWỤKWỌ ABỤỌ ỌZỌ

Spread the love

Bini – Mahadum Edo State Polytechnic, Usen achụọla ụmụ akwụkwọ abụọ e jidere ebe ha nọ n’ụlọ ezumezu mahadum na-akwa iko ka nkịta.

Ozi si n’aka Odeakwụkwọ ukwu nke mahadum ahụ bụ Mazị Simire O. Sịrịl n’abalị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba afọ a kọwara na mahadum ahụ chụrụ ụmụ akwụkwọ abụọ ahụ, Falodun Olabode nakwa Ediae Sylvia maka na mahadum ahụ “anaghị anabata akwamiko chaa chaa”

O tebeghi mahadum Babcock chụkwara nwa agbọghọ nwata akwụkwọ maka onyonyoo ọ sere ebe ya n’enyi ya nwoke na – enwe mmekọahụ. Nkea bụzị “a na-ekwu na oke tagburu mmadụ ngwere a chịrị mma gawa ịpị eze”

Nkea abụghịzị na ha setere onyonyoo ihe ha mere. Mba, e jidere ha abụọ ka ha nọ na-eme nkwakọrịta na nchịkọrịta ahụ n’ụlọ ezumezu mahadum ahụ, n’uhuruchi.

“Nkịta nile na-eri nsị mana nke richaa buru n’ọnụ kpagharịwa, a kpọọ ya orinsị”. Akwamiko n’etiti ụmụ akwụkwọ mahadum abụghị ihe ọhụrụ mana ịkwazị ya bụ iko n’ụlọ ezumezu bụ isi mmebi.

Ugbua, ha laruo, kedu ihe ha ga-akọrọ nne na nna ha? Na a chụrụ ha na mahadum maka na  “akwara rapụtara ha”

Lee akwụkwọ ozi ahụ :

 

Nkea bụ ụwa mmebi. Mmekọahụ bụ eriwe agwụ agwụ. I si taa kwara iko ruo echi, ọ ka ga-agụkwa gị ọzọ maka na “o nweghị ihe e richara agụụ ya laa”.

Keduzi ka ụmụaka ndị be ha dinyere ka gaa mahadum, ga baara onwe ha uru siri jiri Akwamiko nakwa ịkwọkịrịkwọ kwapụ onwe ha na mahadum? Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.