ỊKPỌ NDỊ BỊAFRA, NDỊ NAỊJIRIYA BỤ OKWU AKPỌMASỊ – NNAMDI KANỤ

Spread the love

Mazị Nnamdị Kanụ, Onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB), ekwuola na ịkpọ ya na ndị otu ya ndị na-agba mbọ maka nnwere onwe Biafra, ndị Naịjiriya bụ okwu akpọmasị.

Kanụ kwuru nkea na mgbasa ozi kwa izu ụka ya, ka ọ na-ekwu banyere Atụmatụ iwu Okwu Akpọmasị nọ na Sineti Naịjiriya ugbua.

O kwuru na mmadụ ikwu okwu ịma ikpe ọnwụ maka Okwu Akpọmasị bụ isi mmebi, na o gosiri na ndị ọchịchị Naịjiriya nwere ihe ọzọ ha bu n’obi.

Kanụ kwuru na ịkpọ ya na ndị otu ya ndị Naịjiriya, aha amanyere ha amanye ịza bụ okwu akpọmasị megide ya na nde kwuru nde mmadụ na-eso ya.

“Atụmatụ iwu Okwu Akpọmasị a na Iwu ọchịchị ndị soja nke 4 n’afọ 1984. Ihe na-eme n’Ụlọikpe na Naịjiriya zuru ịmụnye obodo ọkụ. Ịkpọ m onye Naịjiriya bụ okwu akpọmasị”

Ọ katọkwara ndị Sineti maka ịhapụ imebe iwu ga-ebelata agụụ n’obodo were na-etufu oge ha maka imebe iwu n’abaghi uru ọbụla.

” Ha akwụgbubeghi ndị Fulani ndị nchị ehi, ha akwụgbubeghi ndị ekperime juru n’Ugwu Awụsa, ha akwụgbubeghi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ezu ego ọha, ha akwụgbubeghi ndị Gọvanọ na-ala ndụ ndị mmadụ n’iyi site n’akwụghị ha ụgwọ ọnwa”

Kanu kwuru na sọọsọ ihe ga-akwụsị ajọ ihe nile na-aga n’ihu na Naịjiriya ugbua bụ ikewa Naịjiriya ka Biafra nweta nnwere onwe

Leave a Reply

Your email address will not be published.