MAHADUM GREGỌRỊ UTURU ICHI ODUMEJE DỌKỊNTA, O ZIRI EZI?

Spread the love

Ụmụahịa – Mahadum Gregọrị, Uturu, Abịa Steeti nọrọ ụnyahụ bụ Satọdee, abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2019 were chie Onyeamụma Chukwuemeka Ọhanyere, onye a ma dịka Odumeje Dọkịnta  nkwanye ugwu.

Nke a tụrụ ọtụtụ mmadụ n’anya maka na ya bụ Odumeje bụ nwoke “na-eme ihe ụ̀zụ̀”.

Ihe e ji mara ya abụghị akụkọ dị mma na ntị. N’ezie, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-ebuwe ego ụzọ. Okwu Chukwu ha nile na-abụ maka EGO!  EGO!! EGO!!!

Anaghị ekwuzi okwu nchegharị ma ọ bụkwanụ ịmụnwo mmadụ ọzọ.

Nke Odumeje pụzịrị iche maka na sọọsọ ihe a na-egosi ebe ọ na-aka ụka bụ ịghali “dollars” elu nakwa ịgba ịkwọkịrịkwọ n’elu ego.

Ụka ya bụzị maka ndị gburu ozu na ndị butere ike. Ndị a na-abịa emekasị ego n’ụlọ ụka ya bụ ndị amaghị ụzọ ha siri kpata ego.

Ma ha a gwọrọ ọgwụ ego, ma ha abụ ndị ojiegbeezu, ma ha a nọ n’ibu ntụ ka ọ bụ ịtụ akwụkwọ, a bụghịzi ihe a jụrụ.

Ime udiri ngosi ahụ dịka “ijizi ego mere chi” na Naịjiriya ezughiziri ya. Odumeje kpakwara aghara ahụ gaa ala Bekee.

Ka o mechara mmemme n’ụlọ egwu awantịlo na Jakarta, Indoneshiya, o tinyere ọtụtụ ụmụ Igbo nọ mba ahụ soro bịa ghara ya ego na nsogbu.

Mba Indoneshiya gbarụrụ ihu n’udịrị akparamagwa ighali ego elu were n’akwanyeghịrị ego ugwu. Ụfọdụ ndị gara ya bụ mmemme ka ndị mba ahụ gbara ụgbọ nwa mkpi ebe ụfọdụ ka a kpọchiri.

Kaosiladi, Onyenwe mahadum ahụ, Ọkammụta Greg Ibe kọwara na ya bụ nzere mmụta nkwanye ugwu Dọkịnta e nyere “Dọkịnta Odumeje” ziri ezi.

N’ihe kpatara mahadum ahụ jiri nye udiri mmadụ ahụ, okwu ya na-apụ ụka nzere nkwanye ugwu, Ibe kwuru sị

“A họtara Odumeje maka ọrụ obi ebere ya. Oge ọkụ gbara n’Ọnịcha na nso a, ọ gara gbatara ndị nkea metụtara ọsọ enyemaka tupurii Gọọmenti Steeti ahụ abịa.

” Site n’ihe ndị nlekọta mahadum m kwuru, Odumeje sịrị, “Unu na-ahụta m dịka ezigbo mmadụ ma ọ bụ ajọ mmadụ, matakwanụ na a na m agba mbọ ịdọlite ọtụtụ mmadụ n’ime ụbịam.

” Ọtụtụ ndị na-akatọ ya na-eme arụ ka nke ahụ na nzuzo. Nwoke a bụrụ ajọ mmadụ, o nwere ihe akaebe ọ bụla? Ma o nweghị, ka anyị werezịa ọrụ ọma ya kpee ya ikpe, ghara ige ihe a na-ekwu.

” Eddy Nawgu na-agagharị na-ewu ewu  wee ruo oge Chineke ji kpara ya aka, o were kwụọ ụgwọ ihe o mere”

Ibe kọwara na mmadụ abụọ ndị Uturu nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba Ọnịcha ahụ so na ndị Odumeje nyeere ezinụlọ ha aka.

Hmm, Udiri agwa Odumeje ọ bụ ihe kwesịrị nṅomi?

Site echi, hoo!haa!! ga-azọpụ njem ịmata uche obi ọhaneze banyere ya bụ echichi Dọkịnta mahadum Gregọrị chiri nwoke a.

Tọọnụ ntị n’ala.

Leave a Reply

Your email address will not be published.