IKPEAZỤ EMEZUOLA NKWA YA MAKA ỊMALITE ỤLỌ MMEPỤTA AKPỤKPỌ ỤKWỤ ỌGBARA ỌHỤRỤ N’ABA

Spread the love

Aba – Dọkịnta Okezie Ikpeazụ, aka na-achị Abịa Steeti nọrọ taa were mezuo nkwa o kwere ịmalite ụlọ ọrụ mmepụta akpụkpọ ụkwụ ọgbara ọhụrụ n’Aba.

“Aba ma ndị Aba”. Ya mere, Ikpeazu jiri were mgbasa ozi banyere Ngwa ahịa Aba Mere(Made in Aba) mere aka ọrụ site na iyi uwe nakwa akpụkpọ ụkwụ Aba mere kemgbe ọ batara n’ọchịchị.

Site na mgbasa ozi Ngwa Ahịa Aba Mere, Ikpeazu chọpụtara na ndị Aba agaghị emepụtanwu akpụkpọ ụkwụ ọtụtụ etu a chọrọ nakwa oge a chọrọ n’ihi enweghị igwè nrụpụta akpụkpọ ụkwụ.

Ihe mbụ Gọvanọ Ikpeazụ mere bụ iziga ndị Aba mmadụ iri atọ mba Chaịna, ebe ha gara mmụọ usoro iji igwè ọgbara ọhụrụ were rụpụta akpụkpọ ụkwụ.

Site n’okwu Sam Haat, Onye Nlekọta Atụmatụ ahụ, “Ka ndị ahụ gara ọzụzụ na Chaịna lọtara, Gọvanọ Ikpeazụ tụrụ ahịa maka igwè dị iche iche eji arụpụta akpụkpọ ụkwụ na Chaịna. Igwè ndị ahụ abatawokwa Aba.

Gọvanọ rụkwara ụlọ ọrụ mmepụta akpụkpọ ụkwụ ọgbara ọhụrụ ebe a ga-adonye igwè ndị ahụ.

” Ọzọkwa, ndị omenka si Chaịna awuchiela Aba. Gọvanọ nọrọ taa were nyefee ha igwè ndị ahụ n’aka ka ha malite ịdọnye ha”

Mmadụ iri atọ a zụrụ na Chaịna ga-esokwa ndị omenka ndị ahụ si Chaịna were malite ọrụ ebe ahụ. Ha ga – azụlitezi ndị ọzọ n’usoro iji igwè ọgbara ọhụrụ ndị ahụ were ruo ọrụ.

Hmm, ihe a Ikpeazụ mere bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ n’adịghị nchefu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.