ACHỤỌLA NWATA AKWỤKWỌ MAHADUM TỤWARA ONYE NKUZI YA IME

Spread the love

Lafịya – Mahadum Gọọmenti Etiti, Lafịya, Nasarawa Steeti achụọla otu nwata akwụkwọ onye nwoke maka ịtụwa onye nkuzi ya ime.

N’agbanyeghị na nwata nwoke ahụ aha ya bụ Kevin rịọrọ mgbaghara ma kọwakwaa na onye nkuzi ahụ ratara ya ma tinye ya n’ọnwụnwa ọ na editenwughi, ndị isi mahadum ahụ jụrụ ịkpọghachi ya.

Kevin kwuru na ya bụ onye nkuzi ya ekweghị ya kute ume site na ịmanye ya ka ha nwee mmekọahụ.

Ọ sịrị na nwanyị ahụ ukwu na akọ ọkọ nyere ya ntimiwu na ọ bụrụ na ọ jụ, na ọ gaghị agafe n’ule ya.

“N’ihi nkea tinyekwara mma nwanyị a mara, a malitere m idina ya”

Kaosiladi, o nwebeghi ntaramahụhụ ọbụla e nyeworo ya bụ onye nkuzi “ukwu nnu” maka na nwata nwoke ahụ edinaghị ya n’ike.

N’ezie, nwata nwanyị ahụ kwesịrị ịkara nata ntaramahụhụ maka na ọ kpara agwa ka “Nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu”

“Ikpe mara eziokwu, aka azụ dị ya”. Mmadụ abụọ ahụ bụ ndị okenye jiri aka kpebie ịkwarịta iko. Ọ bụrụ na ọghọm dị ya mara na ọ ga-erute ha abụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.