TWITTER EGBUO M! NWOKE NWANYỊ O NWETARA NA TWITTER BỊARA BE YA JỤ ỊLAZỊ

Spread the love

Abụja – Ihe na-emenụ. Otu oko okporo bi Abụja ji ọnụ ya kọọ ka Twitter siri chọọ itinye ya na nsogbu.

Nwa amadị a bụ Kris Aliade bụ onye ọrụ bekee na – agba mbọ dịka ụmụ okorobịa ibe ya.

O nwere ụgbọala Toyota Camry ka nọ n’egwu bi  birikwa na Karu, n’ụlọ mkpuru abụọ (2 bedroom apartment) edoziri nke ọma.

N’izu ụka gara aga “ịkpa aka ana” na Twitter chọrọ ibutere ya nsogbu.

Gezie akụkọ ya:

“E nwere otu asa m nyopuru na Twitter mụ na ya nọ na-akpa nkata kemgbe. Nkata anyị bịara na-adaba nke ọma.

” Ebe o bikwu Abụja, a masara m ya njakịrị n’ụtụtụ Fraịdee, na ngwụcha izu ụka m ga-adị egwu ma ọ bụrụ na ọ bịa ka anyị nọrịa.

“Nnaa, nwata chịkwaa ọchị ma kweta.

“Hmm, a tụghị m anya na ọ ga-esi etu ahụ kweta. Onye ị maghị mbụ? Onye ị hụbeghi anya mbụ?

Kris were tulie mma ya elu n’udi na okwe a gbaala.

Ụbọchị ahụ,  o mechiri ọrụ n’oge. Ọ lara gaa sie nri, hichaa ụlọ were chebiri onye ọbịa pụrụ iche.

N’agbanyeghị na ọ sịrị na ọ ga-abịa na mgbede, Kris e jikerelarịị n’elekere atọ nke ehihie were na-echezi “ahịa ọ tụrụ” . A bịa n’oge, e bido mmekọahụ n’oge.

Nwata bịara ka o siri kwu. Nwoke rikwara ihe na-agụ ya.

Kaosiladi, oge ụtụtụ Satọdee ji eru, ike ya agwụla Kris. Kris so na ndị oko okporo na-eme ha tụrụ ebe a, ha e sere aka, tụrụ ebe nke ọzọ. Ọ chọghị ka otu onye bịa  nọchie ụzọ. Ejirimara ya bụ  “Onye rie, ya chaa”

Nwaagbọghọ a sị na aha ya bụ Amanda abụghịdị ihe na-eche Kris na-eche ya. Nwata gwunyesiri ike, kụọ paa.

“Ebe ọ bụ na ngwụcha izu ụka ka fọdụrụ, a sị m ka m dikwuo nnọkọ mụ na ya otu abalị ọzọ”

Ọ bụghị na nwata anaghị eme ọfụma mana ebumnuche ha abụọ dị iche.

N’uhuruchi Sọnde, Kris tụrụ anya ka nwata kwadoo ụla mana “otu awụghị n’ezi”. Mbanụ, o megharịghịdị ahụ. Ọ na-ekiri onyonyoo “Lord of the Sky” na Telemundo.

Kris achọghịkwanụ ka ọ dị ka ọ na-achụ ya achụ na be ya. Ikekwa, ọ ga-ala n’ụtụtụ.

N’ụtụtụ Mọnde, ka m na-akwado ọrụ ọ ka nọ n’ụra. A kpọtere m ya, gwa ya ebe ọ ga-edebere m igodo ma ọ lawa.

Hmm, lọtara m hụkwa Amanda n’ụlọ. O sikwuru nri abalị. Chai!

“Aah! Aah!! Nne, ị ka nọ ebe a?” Eenụ, ọ nọ ya ma nọsie ike. Ọ saghịdị m okwu ahụ. E riri m nri abalị a kwọrọ aka sie dịka nwoke ji nwanyị.

“Ka m pụziri n’ezi, a hụrụ na ọ sachaala ákwà ya, gbasaa n’ezi. Ịba ya ọ sara asa were ọnọdụ nke ọma n’ime ụlọ mposi m.”

Kris kasiri onwe ya obi site na iche na ákwà ya kọọ n’ụtụtụ echi, ọ laa.

“A batazịrị ọrụ ụbọchị Tuuzdee hụ na ọ sakwuola ákwà nke m. A makwughizi m etu m ga-esi gwa ya na ihe ya agbụwo m, nwa  na-eme ọfụma”

Ka Kris na-aga ọrụ n’ụtụtụ Tọọzdee  Amanda gwara ya ihe ndị ọ ga-azụtara ya ma ọ lọtawa ọrụ. Ka ọ na-aga ọrụ,  Kris kwụsịrị ụgbọala ya n’akụkụ ụzọ were chewe ihe o ji isi kotere onwe ya.

Ọ jụrụ onwe ya sị, “Kris, nkea ọ bụ na nrọ ka ọ bụ n’ife? Keduzi oge ị lụrụ nwanyị n’amaghị ama? Nkea ọ bụzị ịhụnanya?”. Ọ gakwara n’ihu zụta ihe ndị ọ sị ya zụta.

Ka o ruru ụlọ ọrụ, ọ kpọrọ enyi ya nwoke, Fred Ocho, akorogoli ma ihe a na-arụ. Dịka “Ọmọ Eko”, onye bunyere ya uche.

Ka ọ lara na mgbede Tọọzdee ahụ, ọ gwara Amanda na ndị ụlọ ọrụ ya dịnyere ya ọrụ otu izu ụka na Kalaba.

“Hmm, n’abalị ahụ, Chukwu rụrụ ọrụ ebube! Ọ kwakọrọ ihe ya. Ka ọ na-akụ elekere isii ụtụtụ echi ya, anyị ebiliwo, a kwakwọkwara m akpa m.

” E chere m na ọ ga-abanye ụgbọala ọzọ gawara onwe ya mana o siri ọnwụ iduga m ọdụ ụgbọala.”

Kris mechara ka nwa agbọghọ a ghara iso ya mana ọ jụrụ ajụ. N’ihi ya, Kris gara n’ihu iji mee ka ọ dị ka eziokwu.

Ha bara ụgbọala “Uber” were gaa ọdụ ụgbọala God is Good n’Utako, Abụja.

“Nwata ahụ jụrụ ịla ruo n’ụgbọala m bara apụọ. Ọ bụ ịhụnanya na-egbu ya ka ọ na-enyo m enyo?”

Hmm, Kris jiri ihere loo ụkwara. Ọ kwụrụ N7,000 ego ụgbọ iji ga Kalaba. Amanda bịara na mpio ụgbọala ahụ, ha abụọ nọrọ na-akparịta ụka, na-ekwupụta ịhụnanya na nwere onwe ha. Ha nọzị na-ekwu etu anya onye ọbụla n’ime ha ga-esi eme ibe ya.

“Amanda bidokwuru bewe akwa. O metụrụ m n’ahụ, m chọọ ịdara ya wee jide sikwa onwe m ike, gakwaa n’ihu ka uche m adị ya. E kwere m nkwa ịkpọ ya ma m lọta”

Ka ụgbọala ruru Giri, Kris gwara m onye Ọkwọ ụgbọala na ya chọrọ iritu.

Onye Ọkwọ ụgbọala gwara ya sị, ” Agaghị enyeghachikwa gị ego gị!”

Kris gwara ya, “Onye sị gị nyeghachi ya ego? Biko, a na m aga ọrụ, oge na-agalahụ m”

Ihe a mere ihe karịrị ọnwa isii gara aga mana Kris ka sị na ya nọ Kalaba.

Kris gwara ya na ụlọ ọrụ ha sị ya nọrọzịa Kalaba. Amanda kwutere okwu ịbịa hụ ya na Kalaba, Kris gbụrụ onwe ya.

“Nne, mbanụ, a ka m bi na nke nwanne nna m”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.