HMM, NWATAKỊRỊ AFỌ IRI N’ASAA ALỤWO NWA NWANYỊ AFỌ IRI N’ISII NA NNEWI

Spread the love

Nnewi – Somtoo, nwatakịrị dị afọ iri n’asaa  na ọdịya n’obi, onye dị afọ iri n’isii nọrọ na ngwụcha izu ụka gara aga mee ịgba nkwụ  na Nnewi.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara n’akwụkwọ akụkọ Anaedoonline, Somtoo si n’ụmụnna Nwachukwu dị n’obodo nta Okọfịa nọ n’ime Otolo, Nnewi.

Somtoo , onye nke bụ ọdụdụ nwa ndị be ha mụrụ ka e kwuru na ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ n’ọnwa gara aga,ma sie ọnwụ na ọ chọrọ ịlụ nwanyị.

N’agbanyeghị ndụmọdụ ndị be ha nyere ya, nakwa okwu nile a gwachara ya, ọ kachiri ntị na ya chọrọ ịlụ nwanyị.

Ezinụlọ ya kpebiziri inye ya nkwado ma mekwaara ya ịgba nkwụ ahụ.

Ihe n’ekweghị ọhaneze nghọta bụ ihe kpaliri mmụọ nwatakịrị a, ịlụ nwanyị nke taa nke echi, ebe ọ tụwaghị nwatakịrị nwanyị ahụ ime. Ọ kacha ebe ọ bụ na ọ bụghị sọọsọ ya bụ nwa nwoke ndị be ha mụtara.

Nwanne ya nwoke nke tọrọ ya agụchalarịị mahadum ma na arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ nọkwa n’Anambara Steeti.

Ka ha mechara ịgba nkwụ, nne na nna Somtoo mepere di na nwunye ahụ obere ụlọ ahịa nke ha ga-eji na elekọta onwe ha.

Kaọdịtaa, e nwetabeghi aha nakwa obodo obere nwunye ya ahụ.

Mana, ebe ndị ntorobịa igbu onwe ha na-ewuzi, ọ ka mma na a hapụrụ ha, ha alụwa onwe ha, ebe a gwachara ha ha gbaa isi akwara, karịa na onye ọbụla n’ime ha kwụgburu onwe ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.