NDỊ AMOSU ABỊAGHỊZỊ ỌGBAKỌ MAKA AMOSU NA NSỤKA

Spread the love

Nsụka – Ogige “Professor B.I.C. Ijeoma Center for Policy Studies and Research, Mahadum Naịjiriya, Nsụka mechara mee ọgbakọ amosu ha hiwere ime ụbọchị Tuuzdee mana ndị amosu abịaghị.

Otu jikọtara ndị ụka na Naịjiriya, Christian Association of Nigerian (CAN) foburu ntụtụ, na agaghị anwa anwa mee ọgbakọ ahụ ha sịrị na ọ bụ “ọgbakọ ndị amosu chọrọ iji dọbata ndị mmadụ n’otu ha”

Odeakwụkwọ CAN, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, Nna Ụkọchukwu Josefụ Ajụjụngwa kwuru sị, “ọ bụ ọrụ dịịrị onye otu Kristi ọbụla ikpe ekpere megide ọgbakọ ndị Amosu na-achọ ime na mahadum Naịjiriya, Nsụka”

O nweghị ndị amosu bịara ya bụ ọgbakọ kama ndị Ọkammụta wepụtara ohere kọwaa ma nyochaa nkwenye dị iche iche ndị akụkụ ụwa nile were maka amosu.

N’okwu ya, Onyeisi nhazi ọgbakọ ahụ ma bụrụkwa onye nlekọta ogige chikọbara ọgbakọ ahụ, Ọkammụta Egodi Uchendu, kwara arịrị maka akparamagwa ndị Naịjiriya na ndị Afrịka ndị ọzọ nke na-eme ka anyị kwedosie ike n’usoro obibi ndụ ọbụla mara anyị ahụ, n’achọghị ịnabata nkọwa ọzọ ọbụla.

O kwuru na ihe kpatara ha ji malite ọgbakọ ahụ bụ okwu onyeisi ọchịagha ndị agha Naịjiriya bụ Tuku Buratai kwuru na ihe ha ejibeghi nwee ike imeri ndị Boko Haram bụ maka ihe mmụọ, anaghị ahụ anya.

“Izu ụka gara aga, otu Fada kọkwara etu e siri kpọọ onye o ji mere nne ọkụ na ndụ, na a sị na ọ bụ amosu”.

“Na ndị ụkọchukwu na ndị ụka ndị ọzọ na ekpe ekpere megide amosu gosiri na ọ dị”

Leave a Reply

Your email address will not be published.