NTỌỌ! ỌGBATUMTUM AKUTUOLA ONYE OHI PỤNAHỤRỤ NWANYỊ MMADỤ AKPA

Spread the love

Sapele – Onye ohi napụrụ nwanyị mmadụ akpa ya na Ajimele dị na Sapele ka hoo!haa!! nụrụ na ọgbatumtum kụtuziri ya ka ọ na-agba ọsọ.

Nkea mere ụbọchị Mọnde na Sapele, Delta Steeti.

Ndị ohi ahụ dị mmadụ abụọ were pụnahụ nwanyị mmadụ akpa ya. Ụmụ okorobịa nọ nso nụziri mkpu ákwà ya were ọgbatumtum chụwa ndị ohi ahụ.

Ndị ohi ahụ gbara ọsọ nile ha gbara mana ndị na-achụ ha sochiri ha azụ. Otu n’ime ha wụfeziri mgbidi ụlọ akwụkwọ nọ n’akụkụ ebe ahụ.

Onye ajọ chi ka e ji ọgbatumtum kụtuo, ka ọ na-achọ ịwụfekwu.

N’agbanyeghị nkea, chi ya mụ anya. Ụfọdụ chọrọ ịkpọ ya ọkụ na ndụ ozigbo mana ndị ọzọ rịọrọ ka a hapụ ya ndụ, ebe ọ tọgbọzị n’enwetaghị onwe ya.

E bugazịrị ya ụlọ ọgwụ, ịga zọọ ya ndụ.

Hmm, ya kelee chi ya na ọ bụghị n’Aba ma ọ bụ Ọnịcha ka o zuzuru udiri ihe ahụ. A gaghịdị ahụ ozu ya anya.

Chi nwanyị ahụ lụụrụ ya ọgụ. N’ezie, “ehi n’enweghị ọdụ, chi ya na-achụrụ ya ijiji”

1 Comment

  1. Ọ bụ ụbọchị iko ha jụrụ.




    1



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.