GANA: ONYE EZE AKPỤỌLA ỌKỤ ENU SERE ONYONYOO AKWAMIKO ONWE YA ISI PỊA YA ỤTARỊ

Spread the love

Tamale, Gana – Onye eze Dakpema nke Tamale enyela iwu ka akpụọ otu nwa agbọghọ obodo ahụ bụ ọkụ enu isi maka imebe onyonyoo ebe ya na mmadụ na-eme akwamiko.

Onye eze ahụ were iwe maka na ọkụ enu ahụ egosighi mwute ọbụla, kama o ji ya anya isi.

Ndị nche obi eze kpụpụtara ya n’ọha, kpụchasịa ya isi ma pịa ya ube ịtalị iri n’abụọ.

A sị na ntaramahụhụ ahụ bụ maka ihere o wetara ndị obodo ahụ nakwa iji dọọ ndị ọzọ aka na ntị.

Onye eze ahụ gwara ya sị, “Anyị chọrọ ka ị mara na i nwere nne na nna, nakwa ezinulo ndị ị na-emechu ihu.”

Ya bụ onye eze  Dakpema nke Tamale gwakwara ọkụ enu ahụ na ọ ga-eweta ebili abụọ tinyere ọkụkọ olemole iji medaa ndị mmụọ obi maka ajọ akparamagwa ahụ. 

Leave a Reply

Your email address will not be published.