NDỊ OJI EGBE AWAKPOLA NDỊ OTU EGWU BỌL IFEANYI ỤBA NA LOKOJA

Spread the love

Lokoja –  Ndi oji egbe awakpola ndị otu egwu bọl Ifeanyị Ụba n’ehihie taa bụ Fraịdee, abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2019.

Nke a mere n’ebe Lokoja, Kogi Steeti, ka ha ji ụgbọala aga Dutse maka asọmmpi ha na ndị Jigawa Golden Stars nke Dutse kwesịrị inwe echi bụ Satọdee.

Ndị oji egbe ahụ, site n’ozi hoo!haa!! nwetara yi uwe ndị NYSC.

Kaọdịtaa, ndị otu egwu bọl Ifeanyị Ụba na-agba ndị nke iri n’agba asommpi egwu bọl nke afọ 2019 /2020.

O nwebeghi ndị mma ihe butere mwakpo nkea ebe ọ bụ na o nweghị ihe ha e zuru.

E bugakwara ndị e merụrụ ahụ n’ ụlọ ọgwụ na Lokoja. Ọ dịghịkwa ka asọmmpi ha kwesịrị inwe echi ka ga enwe isi.

Hmm, nsogbu dịkwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.