Abụja – Sharịya dị ka ọ malitewo n’udi pụrụ iche n’Abụja bụ isi obodo Naịjiriya.  Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na oke ụlọ nkwari akụ e ji mara Abụja, Transcorp Hilton Abuja anaghịzị anabata nwanyị ọbụla n’enweghị nwoke du ya bịa. Ọkammụta Chịdị Ọdịnkalụ gbara àmà n’ámáozi Twitter ya na ụlọRead More →

Legọs –  Ndigbo nakwa ndị nnọchiteanya mpaghara Naịjiriya ndị ọzọ ga-anọ ụbọchị Mọnde, abalị iri n’atọ nke ọnwa Jenụwarị , afọ 2020 were nwee ọgbakọ ukwu pụrụ iche maka agha Bịafra. Ọgbakọ ahụ nke ga-adị n’Ụlọ ezumezu Agip Recital Hall nke nọ n’ogige Muson Centre, Legọs ga-amalite n’elekere iri nkeRead More →

Amerika – Gọọmenti mba Amerịka anwuchikọọla Abaeze Atuche, nwa afọ Naịjiriya na-atụ akwụkwọ, onye yiri ndị Amerika egwu site na ime ihe mmadụ emetụbeghị mbụ. Nwaamadị a dị iri afọ abụọ n’itolu tiwara ọbaozi mba Amerịka n’onwe ya were nye ndị ezinụlọ ya nile tinyere ndị enyi ya mmadụ iriRead More →

Enugwu – Otu  Indigenous People of Biafra, IPOB, agọpụla onwe ha ma kọwaa dịka nkọgheri bụ ebubo nke ndị isi ndị agha Naịjiriya na-ebo na ọ bụ ndị IPOB kesara n’ọba ozi onyonyoo ebe ndị Boko Haram na-asụ ndị soja Naịjiriya akwụ. Ozi Ọnụ na-ekwuru IPOB, Emma Powerful tinyere akaRead More →

Legọs – Akwụkwọ akụkọ Punch nọrọ taa were kwuo hoo!haa!! na site taa gawa, na ha ga na-akpọzị Onyeisiala “Maj.Gen. Buharị” ebe ọ bụ na ọ ka na – achị ọchịchị ndị soja. Nkea bụ maka etu ọchịchị Buharị siri were leghara ọchịchị onye kwuo uche ya, ịgbaso usoro iwu(RuleRead More →

Abụja – Onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadụ nọrọ taa  bụ Wenezdee were welite okwu n’ọgbakọ Sineti nke isiokwu ya bụ “Etu Anamachọrụ si arịzị ibe ya elu n’obodo a”.  Na mkpebi ya, Sineti kpọrọ mkpu ma bekukwaa Gọọmenti ma nke Etiti, Steeti nakwa nkeRead More →

Abụja –  Sinetọ Tiodọ Ahamefule Ọjị, onye rịturu n’ọkwa dịka Gọvanọ Abịa Steeti ka hoo!haa!! nwetara ozi na ọ na nke ndị EFCC ugbua n’Abụja were na-azara ọnụ ya maka ebubo iri ngarị ego dị Ijeri Naịra iri abụọ n’asaa oge ọ nọ n’ọkwa dịka gọvanọ. Sinetọ Tiodọ Ọjị, kaRead More →

–A husiri anya, ụgwọ e ji m karịrị N80M  -Nkọgheri ka ọ na-akọgheri – Oko Ẹnyịm  Abakaliki –  Hon. Marịya Ude Nwachi, onye a maara dịka Afikpo Chic etiela mkpu ka a gbatara ya ọsọ enyemaka maka ihe ọ na-agabiga n’aka Gọvanọ Ebọnyị Steeti, Omenka Devidi Nweze Ụmahị. Afikpo ChicRead More →

Legọs – Ọkaikpe Josef nke Ụlọikpe Ukwu Legọs Steeti nọrọ taa bụ Mọnde n’Igboshere, Legọs were tụọ mmadụ abụọ so na ndị isi ụlọakụ Keystone nga afọ ise maka iji ụzọ aghụghọ were napụ mmadụ ego. Onye ọzọ ụlọikpe ahụ makwuru ikpe bụ Mazị Ashok Israni, Onyenwe Ụlọ mmepụta ngwaahịaRead More →

Ọka – Mazị Wili Okafọ, Onye Nlekọta nke Ụlọ ọrụ, Anambra State Housing Corporation, a kpọkuola ndị obodo ndị ọzọ ka ha ṅomie otu Aguleri People’s Forum site na ịkwado ọrụ ga-eweta mmepe obodo na be ha.  Okafọ kwuru nkea ụbọchị Satọdee n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Ọka banyereRead More →

Madrid, Speenu – Ka a na-edozi nsogbu dapụtara ụbọchị Mọnde n’Ọraifite, Anambara Steeti n’etiti ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) na ndị Uwe Ojii, IPOB nọkwara ụbọchị Fraịdee wakpo Mazị Chibuike Amechi, Mịnịsta na-ahụ maka Ụgbọ Njem na Madrid, Speenu. Mazị Ịmanụelụ Kanụ( Emma Powerful), Ọnụ na-ekwuru IPOB ekwuola hoo!haa!Read More →

Abụja – Owele Anayọ Rochas Okorọcha bụ Sinetọ na – anọchite anya Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Imo etiela mkpu na n’oge n’adịghị anya na aga enwezi ndị Sinetọ si Ugwu Awụsa n’agaghị ama asụ bekee chaa chaa.  Okorọcha, onye bụ Gọvanọ chịburu Imo Steeti kwuru nke ka ọ na-etinye ọnụ n’okwuRead More →

Okwu nhazigharị ọchịchị obodo na-emerụzị Naịjiriya ahụ – Agbakọba Legọs – Dọkinta Olisa Agbakoba (SAN), onye bụbu onyeisi otu ndị Ọkaiwu na Naịjiriya bụ Nigerian Bar Association (NBA) akpọọla oku ka a kwụsị agbambọ banyere nhazigharị usoro ọchịchị Naịjiriya. Agbakoba kwuru na ya bụ agbambọ ahụ anọteela aka na amịtaghịRead More →

Enugwu – Rt. Hon. Tobi Okechukwu, onye nnọchiteanya Mpaghara Ọ̀gwụ̀/ Oji Riva/Aninri n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta Naịjiriya nọrọ ụbọchị Mọnde were gosi ihe mere e jiri chie ya Omereọha. Okechukwu, onye ahọpụtaworo ịnọchiteanya ndị be ha ugboro atọ n’Ụlọ Nzukọ ala anyị chetara ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị ọ gụrụ akwụkwọ bụRead More →

Ọnịcha – Kaọdịtaa, o dobeghi anya ihe butere ọgụ n’etiti ndị otu IPOB na ndị Uwe Ojii tinyere ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ụnyahụ n’Ọraifite dị n’Okpuru Ọchịchị Ekwusigo, Anambara Steeti. N’ozi nke Onyeisi IPOB  Mazị Nnamdi Kehinde Kanu n’onwe ya tinyere aka, Kanu kwuru na ndị Uwe Ojii naRead More →

Ọnịcha – Onyonyoo na-ewu ewu n’ọba ozi ugbua gosiri ụkọchukwu na-eme ihe ụzụ, Onye amụma Chukwuemeka Ọhanyere (Odumeje) ebe ọ na-agwa nwa ụkọchukwu ibe ya ka ọ kwadowe maka akwamozu ya, na ya bụ Odumeje nwere ike ịgwọ ya ma na ya agaghị agwọ ya.  Odumeje na-ekwu na nwa ụkọchukwuRead More →

Abụja – Onye ọbụla nwere anya e ji ahụ ụzọ mara na ihe amaghịzị kwụrụ n’etiti Onyeisiala Muhammadu Buharị na Onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC, Asiwaju Bola Ahmed Tinubu. N’agbanyeghị mbọ nile ndị otu Tinubu na-agba, o doola ewu n’ọkụkọ anya na ya bụ afọ ime abụghịkwa ihe aRead More →

Enugwu – N’ụbọchị Wenezdee, abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Nọvemba afọ 2019, otu Igbo Koleji nakwa Ụlọ Mgbasa Ozi Coal City FM, Enugwu jikọrọ aka were chikọba Asọmmpi Nzarịta Ajụjụ maka ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị nke afọ 2019. Ya bụ asọmmpi nke nọ n’afọ nke abụọ ya bụ n’ụlọ ezumezuRead More →