A GA M AGBA ỌTỌ NỌCHỊE SANWO-OLU ỤZỌ – SUZAN PATRIKI

Spread the love

Legọs – Suzan Patriki, omebe ejije Nọliwud na-ewu ewu a nọrọla n’amaozi Instagram ya were zọ̀ọ̀ mba ịgba ọtọ ga kwụchie Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs Steeti n’obi Gọọmenti Steeti ahụ n’Alawụsa, Ikeja ụbọchị Mọnde banyere mpụ ọ sị na-aga n’ihu n’ọchịchị ya.

Patriki kwuru na ndị Otu Ọrụ aka ọkụ Legọs Steeti maka okporo ụzọ (LASTMA) buuru ụgbọala ya maka ịda iwu okporo ụzọ.

Kaosiladi, mbọ nile ọ gbara ịgbapụta ụgbọala ọhụrụ ya ahụ n’aka ha kpụrụ afọ n’ala.

Omebe ejije a bụ onye Ákwá Ịbọm sịrị na ihe bụ iwe ya bụ na ndị ọzọ e jidere ụgbọala ha nọrọ ebe ahụ kwụọ ụgwọ ma gbarakwa ụgbọala ha ebe e buuru nke ya gawazie n’Obi Gọọmenti steeti ahụ.

Ọ gwaziri Gọvanọ ahụ ka ọ dọọ ndị ọrụ ya aka na ntị, ka ha tọhapụ ụgbọala ya ma ọ bụkwanụ ya agbara ọtọ bịa nọchie Obi Gọọmenti steeti ahụ ụbọchị Mọnde.

Hmm, Suzan Patriki, Ada nne, cherekwa. Ọ na ị nweghị ego ịkpọ onye ọka iwu ma ọ bụrụ na Gọọmenti na-enye gị mmekpa ahụ ma ọ bụ na-emegide ikike ruuru gị dịka nwa amaala n’udịrị ọbụla?

Leave a Reply

Your email address will not be published.