“Ị DỊ OKE ANYAUKWU!” GỌVANỌ MATAWALLE NKE ZAMFARA NA – AGWA YARI

Spread the love

Gusau – Gọvanọ Bello Mohammed Matawalle nke Zamfara Steeti agwala onye ọ nọchiri n’ọkwa ọchịchị bụ Alahaji Abdulaziz Yari na ọ chọrọ imebi aha ya maka oke anyaukwu ya.

Ọ bụ Yusuf Idris, Onye Nlekọta Mgbasa ozi gọvanọ ahụ kwuru nkea

“Mụ na onye ịla ndụ ndị mmadụ n’iyi malitere n’ọchịchị ya enweghị okwu ọbụla maka na ọ chọrọ ka m daa etu o siri daa”

Matawalle kwuru na sọọsọ ihe bụ mkpa Yari bụ ụzọ ọ ga-esi jiri anyaukwu bukọrọ ego Steeti ahụ.

“Ọ bụrụ na Yari na ndị otu ya enweghị aka ha ga-enye ime ka e nwee udo na steeti a, ha kwụsị imegharị Gọvanọ Matawalle anya n’ọrụ ọ na-arụ”

Chetakwa na Gọvanọ Matawalle eboola Alahaji Yari ebubo na aka ya dị na nkwafu ọbara dị na steeti ahụ.

Matawalle kwuru na oge ọbụla Yari batara Steeti ahụ na ịla ndụ ndị mmadụ n’iyi na ebirikwa ọkụ. Ọ zọkwara mba ịkpọchi Yari ma ọgbaghara gakwaa n’ihu na steeti ahụ.

Gọvanọ ahụ kagbukwara atamkpo ego dị nde Naira iri (N10million) Yari mebere n’iwu oge ọ nọ n’ọkwa a ga na-akwụ ndị bụburu Gọvanọ na steeti ahụ.

hoo!haa!! na-arịọzị ndị Gọvanọ Steeti dị iche iche n’Ala-Igbo ka ha ṅomie Matawalle site na ịkagbu ọkpụrụkpụ ego ndị chịburu Steeti ha mapụtara a ga na-akwụ ha n’agbanyeghị ihe isi ike karịrị taa n’obodo.

Hmm, ọ dịkwa mma ka ndị a na-achị anyị na-enwe esemokwu n’etiti onwe ha oge ụfọdụ iji mee ka ha gbapuo onwe ha afọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.