UGWUANYỊ AGWAKAALA NDỊ ÌSÌ NUJ, ENUGU OKWU AHỤ̀ MAKA IRE ALA HA AGHARA AGHARA

Spread the love

Enugwu – Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt Hon Ifeanyichukwu Ugwuanyi, agwakaala ndị ìsì otu jikọrọ ndị nta akụkọ bụ Nigeria Union of Journalists (NUJ), ngalaba Enugwu Steeti okwu ahụ̀ maka etu ha siri ere ala ndị otu ahụ aghara aghara.

Ugwuanyi, onye nke Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasa ozi na steeti ahụ, Nnanyelugo Chidi Arọ nọchitere anya ya kwuru nkea na mmemme Izu Ụka ndị Nta Akụkọ e mere n’Enugwu na ngwụcha izu ụka a.

“Ndị nta akụkọ na steeti na akpọku Gọọmenti steeti a ịbịa rụọ otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ n’ogige Press Centre mana kedu ebe ohere dị maka ịrụ ihe ọbụla?

“Ọ bụ ihe ihere na n’ime obosara ahụ nile Ichie Ukpabị Asịka nyere unu, sọọsọ ihe fọrọ bụ ụlọ a ebe Press Centre dị

“Asịka enyeghị unu ala a ka unu resị ma ọ bụ tọọrọ ya onye ọbụla. O nyere unu ya dịka Press Centre”

Oge onye jibu ọkwa dịka Onyeisi ụlọ ọrụ Nigerian Communication Commission, Ichie Ernest Okonkwo chọburu ịrụrụ ndị nta akụkọ ọba akwụkwọ ebe ahụ, ndị isi NUJ, Enugwu chọrọ ka onye ha ego ahụ ka ha kesaa.

Kama iji ya mere ogige nnyocha maka ndị nta akụkọ nakwa ndị ọzọ nwere mmasị na mmụta, ndị nile chịburu otu ahụ ji ya akpara ego site na ịkpabiri ala ebe ahụ ree ma ọ bụ tọọrọ mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.