ASỌMMPI NZARỊTA AJỤJỤ IGBO NKE FRCN, ENUGWU: ỤLỌ AKWỤKWỌ SPRING OF LIFE ETURULA UGO

Spread the love

Enugwu – N’ụbọchị Wenezdee, abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Nọvemba afọ 2019, otu Igbo Koleji nakwa Ụlọ Mgbasa Ozi Coal City FM, Enugwu jikọrọ aka were chikọba Asọmmpi Nzarịta Ajụjụ maka ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị nke afọ 2019.

Ya bụ asọmmpi nke nọ n’afọ nke abụọ ya bụ n’ụlọ ezumezu Sam Nwaneri dị n’ogige ụlọ mgbasa ozi mgbasa FRCN, Enugwu ka a nọrọ mee ya.

Ụlọ akwụkwọ asatọ sonyere n’asọmmpi nke afọ a. Ha gụnyere Government Secondary school, GRA, Enugwu, Day Secondary School, Independence Layout, Enugwu, Bishop Otubelu Memorial secondary school, Enugwu na kings High school,New haven Enugwu.

Ndị ọzọ bụ Good Shepherd Anglican Seminary School, Enugwu, Spring of Life International School,Enugwu, New Layout Secondary school, Enugwu tinyekwara Uwani Secondary school,Enugwu.

Ndị mkpebi asọmmpi ahụ gụnyere Ichie Chinedum Ọfọmata, Oriakụ Evelyn Igbokwe nakwa Oriakụ Chinwe Nwaụda.

Ụlọ akwụkwọ nile sonyere na ya bụ asọmmpi nwetara asambodo nsonye. Ndị nke gbara site na ndi nke mbụ ruo na ndị nke atọ nwetazịrị asambodo nturu ugo.

Onyonyoo ndị bịara ya bụ Mmemme

Ụlọ akwụkwọ gbara ndị nke mbụ bụ Spring of life international school, Enugwu. Day Secondary School, GRA, Enugwu gbara ndị nke abụọ ebe New Layout Secondary School gbara ndị nke atọ.

N’okwu ya Oriakụ Jọyị Obitụlata Ijọmanta, Onye Nlekọta Ụlọ Mgbasa Ozi Coal City FM, onye nochitere anya Mazị Ike Okere, Nnukwu Onyeisi Ụlọ Mgbasa Ozi FRCN, Enugwu kọwara na ya bụ asọmmpi bụ ụzọ ụlọ mgbasa ozi ahụ si enye aka ịkwalite asụsụ Igbo.

“Obi dị m ụtọ na asọmmpi nke afọ bawanyere karịa nke afọ gara aga. Mmemme a bụ otu ụzọ FRCN, Enugwu si agba mbọ ịkwalite asụsụ Igbo”

N’okwu nke ya Mazị Ibiam Ude Ufiem, onye haziri ya bụ Mmemme kelere nnukwu Onyeisi Ụlọ Mgbasa Ozi FRCN, Enugwu bụ Mazị Ike Okere maka mmasị o nwere na ịkwalite asụsụ Igbo.

“A na m ekele Onyeisi anyị bụ Mazị Ike Okere maka mmasị o nwere na ịkwalite asụsụ Igbo. A na ekelekwa ndị ụlọ akwụkwọ sonyere n’asọmmpi nke afọ a”

Mazị Ufiem, onye bụ ọkaibe na ịma mbem rịọkwara ndị nne na nna ka ha na asụrụ ụmụaka ha Igbo n’ụlọ

Leave a Reply

Your email address will not be published.