TINUBU ATỌKỊRỊLA:BUHARỊ JỤRỤ IKWE NWUNYE YA N’AKA NA MMEMME

Spread the love

Abụja – Onye ọbụla nwere anya e ji ahụ ụzọ mara na ihe amaghịzị kwụrụ n’etiti Onyeisiala Muhammadu Buharị na Onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC, Asiwaju Bola Ahmed Tinubu.

N’agbanyeghị mbọ nile ndị otu Tinubu na-agba, o doola ewu n’ọkụkọ anya na ya bụ afọ ime abụghịkwa ihe a ga-eji aka kpuchie.

Nke na-ewu ugbua bụ na Onyeisiala Buharị wuchiri n’ogige International Conference Centre, Abụja maka mmemme e mere ụbọchị Tọọzdee gara aga, kwechaa ndị ọzọ nwere agba bịara ịnabata ya n’aka, mafee Sinetọ Remi Tinubu, mee anya ka ọ hụghị ya.

Mmemme ahụ bụ mmemme a, kpọrọ “E-Nigeria International Conference , Exhibition and Awards” nke mịnịstrị na-ahụ maka Nzikọrita ozi chịkọbara.

Onyonyoo wusaworo ebe nile n’ọba ozi gosiri ka Onyeisiala Buharị si n’ụgbọala Mercedes Benz Onyeisiala rituo, ndị nwere agba kwụrụ n’ahịrị na – ekwe ya n’aka iji nabata ya.

Mịnịsta na-ahụ maka Nzikọrita Ozi, Isa Pantami kwere Buhari n’aka, nwunye Tinubu hulata ikele Buhari mana Onyeisiala mafere ya were kele Gọvanọ Abdullahi Sule, nke Nasarawa Steeti, onye kwụ Sinetọ Remi Tinubu n’akụkụ.

Sinetọ Tinubu nọkwanụ ebe ahụ n’ọkwa ya dịka Onyeisi oche Kọmitii Nzikọrita Ozi nke Sineti Naịjiriya.

Ka Tinubu na-ehulatakwa nke abụọ ikele ya, Buharị gakwara n’ihu ikwe Inụwa Abdullahi, Nnukwu Onye Nlekọta nke ụlọ ọrụ National Information Technology Development Agency n’aka.

Hmm, ọnọdụ Tinubu aghọọla “jewe eje adịghị mma, lawa ala adịghị mma”

Leave a Reply

Your email address will not be published.