“AGAGHỊ M AGWỌ GỊ, KWADOO AKWAMOZU GỊ!” ODUMEJE NA-AGWA NWA ỤKỌCHUKWU IBE YA

Spread the love

Ọnịcha – Onyonyoo na-ewu ewu n’ọba ozi ugbua gosiri ụkọchukwu na-eme ihe ụzụ, Onye amụma Chukwuemeka Ọhanyere (Odumeje) ebe ọ na-agwa nwa ụkọchukwu ibe ya ka ọ kwadowe maka akwamozu ya, na ya bụ Odumeje nwere ike ịgwọ ya ma na ya agaghị agwọ ya. 

Odumeje na-ekwu na nwa ụkọchukwu ahụ butere ọrịa mmịnwụ (HIV) site na inwe mmekọahụ ya na nwoke ibe ya bụkwa onye ụkọchukwu.

Kaọdịtaa, amatabeghị onye bụ nwa ụkọchukwu ahụ ma ọ bụ nna ya.

Odumeje bụ “anụ a na-agba egbe, ọ na-eri ọkpa”. A na-ekwu nke o mere, o mee ọzọ

Onye amụma Odumeje nọrọ na nso nweta echichi nzere mmụta Dọkinta na Mahadum Gregọrị, Uturu, Abia Steeti. Ruo taa, ọhaneze ka na-ajụ ma ya bụ echichi Dọkịnta ahụ mahadum ahụ nyere ya e ziri ezi maka udiri ihe e ji mara ya.

Kaosiladi, Odumeje bụ “azụ anụ ụka”

Leave a Reply

Your email address will not be published.