ỌGỤ NDỊ IPOB NA NDỊ UWE OJII N’ỌRAIFITE: GỊNỊ MERE?

Spread the love

Ọnịcha – Kaọdịtaa, o dobeghi anya ihe butere ọgụ n’etiti ndị otu IPOB na ndị Uwe Ojii tinyere ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ụnyahụ n’Ọraifite dị n’Okpuru Ọchịchị Ekwusigo, Anambara Steeti.

N’ozi nke Onyeisi IPOB  Mazị Nnamdi Kehinde Kanu n’onwe ya tinyere aka, Kanu kwuru na ndị Uwe Ojii na ndị Soja wakporo ụlọ onye ọka iwu ya ụnyahụ bụ Mọnde n’Anambara Steeti.

Ozi ahụ kwukwara na ndị IPOB mmadụ atọ nwụrụ na mwakpo ahụ.

Ọ kpọkukwara otu mba ụwa dị iche iche ka ha tinye ọnụ na mmaja nakwa mmekpa ahụ ndị IPOB na-agabiga na Naịjiriya.

“Etu a ka e si wakpokwa ma gbuo ndị otu IPOB abụọ ndị nọ ọgbakọ n’Arọndizuọgụ ụbọchị Sọnde, abalị mbụ nke ọnwa Disemba, n’eme nta eme Imo. Ozu ha ka dọsa n’ọba ozu”

Kaosiladi, ozi nke SP Harụna Muhammad, ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii n’Anambara Steeti wepụtara na-akọwa na ndị IPOB wakporo ndị otu ha ndị bịara ịkpụrụ Ọka iwu Ifeanyi Ejiọfọ, ka ọ bịa zara ọnụ ya maka mkpesa e wetara megide ya banyere ntọrị, mwakpo nke butere oké mmerụ ahụ nakwa imebi ihe mmadụ.

“Ka ndị ọrụ anyị nke ACP Oliver Abbey nọ n’isi ya rutere ebe ahụ iji kpụrụ onye ahụ e boro ebubo, onye jụrụ ịbịa zara ọnụ ya, ndị IPOB jiri egbe na mma wakpo ha ma gbukwaa mmadụ abụọ n’ime ha”

Ozi na-ewusa ebe nile ugbua bụ na ndị Uwe Ojii sunyere ọkụ n’ụlọ Ifeanyị Ejiọfọ bụ ọka iwu IPOB ebe ndị Ọraifite gbazịrị ọsọ ndụ maka na ndị Uwe Ojii na-anwụkọsị ndị mmadụ aghara aghara.

Ichie Femi Fani Kayode, ezi enyi Ndigbo, onye ka si Ọraifite, ebe ọ bịara Ejiọfọ mgbaru maka Akwamozu nwanne ya nwoke rịọkwara ka ọgụ gboo n’ihi na “udo ka mma  karịa tigbuo zọgbuo”

O nweghị onye ma ka ọgụ ahụ siri bido mana nke bụ eziokwu bụ na ndị IPOB nakwa ndị Uwe Ojii ụfọdụ tufuru ndụ ha.

Ndigbo, ka anyị werenu uche kụọ ọkpa maka na “Onye ndị iro gbara gburugburu na-eche ndụ ya nche mgbe nile”

Leave a Reply

Your email address will not be published.