AKA AKPARALA NDỊ OHI ABỤỌ ZURU ÍGWÈ ỌKỤ MA REE YA N10,000

Spread the love

Akure – Aka akparala ndị ohi abụọ zuru ígwè ọkụ (generator) mmadụ dọwara n’ihu ụlọ ahịa ya n’Ibillo dị n’Ondo Steeti ka ọ gachara izu ụka abụọ ha jiri zuo ya. 

Ndi nche ogbe bụ ndị magidere imi n’ala were nyochapụta onye ha resiri ya bụ ígwè ọkụ nke ha refuru erefu site na ire ya Puku Naira iri (N10,000) ebe ọnụ ahịa ya kwesịrị ịbụ Puku Naira iri isii (N960,000).

Site n’okwu onye nwe ya bụ ígwè ọkụ Sumec,  Mazị Stivinu Adebisi, ndị ahụ a na-ebo ebubo zuru ígwè ọkụ ọ dọwara n’ihu ụlọ ahịa ya ma rekwaa ya puku Naira iri.

“Ndị ekperime abụọ a zuru ígwè ọkụ m dọwara n’ihu ụlọ ahịa m n’ebe elekere asatọ nke abalị.

.

“Oge ahụ, a na m erewe ndị mmadụ ahịa n’ime ụlọ ahịa m. Ha buru ya gbalaga, ree ya puku Naira iri. Taa, Chukwu agbaala ha n’anwụ”

Ndị nche ogbe ahụ nyere ụmụ okorobịa ahụ nọ n’agbata afọ iri abụọ n’asaa nakwa iri abụọ n’atọ ntaramahụhụ dị iche iche.

Kaọdịtaa, o nweghị onye mazị ihe e mere onye ha resịrị ya bụ ngwa ahịa ha zuru ezu maka na onye zụrụ ihe e zuru ezu bụkwa onye ohi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.