MAKA ỤJỌ BUHARỊ:KA AHAPỤ OKWU NHAZIGHARỊ USORO ỌCHỊCHỊ OBODO – AGBAKỌBA

Spread the love

Okwu nhazigharị ọchịchị obodo na-emerụzị Naịjiriya ahụ – Agbakọba

Legọs – Dọkinta Olisa Agbakoba (SAN), onye bụbu onyeisi otu ndị Ọkaiwu na Naịjiriya bụ Nigerian Bar Association (NBA) akpọọla oku ka a kwụsị agbambọ banyere nhazigharị usoro ọchịchị Naịjiriya.

Agbakoba kwuru na ya bụ agbambọ ahụ anọteela aka na amịtaghị mkpụrụ ọbụla, na ọ na-emerụzị Naịjiriya ahụ karịa inyere ya aka.

O kwuru na ebe Onyeisiala Muhammadu Buharị ekwetaghị na nhazigharị ọchịchị obodo, na ndị isi otu agbụrụ dị iche iche dịka Ọhaneze na Afenifere tinyere ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị kwesịrị ịkwụsị ya ka obodo a were gaa n’ihu.

Kama, ọ kpọrọ oku ka a malite usoro ọchịchị ọ kpọrọ “cooperative federalism.”

Agbakọba kwuru nkea ụnyahụ n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’ụlọ ọrụ ya n’Ikoyi, Legọs.

“Onyeisiala ekwetaghị na ya, site n’iwu ala anyị Onyeisiala bụ ya nwere ikike ikpebi ihe ga-eme. Ya bụ, Onyeisiala ekwetaghị na ya, anyị bụ ndị ga – ata ahụhụ. Kama, ka anyị chọọ nkwenye ọzọ ”

” Ka anyị kwụsị okwu maka nhazigharị usoro ọchịchị obodo. Ọ bụghị na m ekwenyeghi na ya  kama ọ bụ maka na ọ na-ebute nsogbu ”

Kaosiladi, okwu Agbakọba wutere ọtụtụ ndị Naịjiriya, ndị maara ya nke ọma.

Mazị Yinka Odumakin, ọnụ na-ekwuru Afenifere kwuru na Afenifere tinyere ụmụ Naịjiriya nile chọ́rọ́ agamnihu ala anyị agaghị akwụsị ikwu okwu maka nhazigharị usoro ọchịchị obodo.

“Buhari sịzịa anyị nwụọ, anyị a ga-ekwe were nwụọ? Ihe fọrọ Buhari n’ọkwa ọchịchị bụ afọ atọ.

“Chetakwa okwu Ọchịagha Aleksị Ọgọmudia na “Ọ bụrụ na e kweghị ka e were, udo nọrọ ala kpaa maka nhazigharị usoro ọchịchị obodo a, na ọ ga-abịa site n’ọgbaghara”

Ọkaiwu Ben Ezeagụ, otu onye a ma ama maka ikike dịịrị mmadụ ma bụrụkwa enyi Agbakọba kwuru na ihe ndị nta akụkọ kwuru abụghị ihe Agbakọba kwuru

“Mbanụ! Olisa Agbakoba nke m mma agaghị ekwu udiri ihe ahụ. Gba ndị nta akụkọ nkịtị”

Hmm, bikonu, anyị aga ejizi ụjọ daara enwe n’elu

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.