OMEREỌHA RT. HON. TOBI OKECHUKWU, O MERE ỌHA N’EZIE

Spread the love

Enugwu – Rt. Hon. Tobi Okechukwu, onye nnọchiteanya Mpaghara Ọ̀gwụ̀/ Oji Riva/Aninri n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta Naịjiriya nọrọ ụbọchị Mọnde were gosi ihe mere e jiri chie ya Omereọha.

Okechukwu, onye ahọpụtaworo ịnọchiteanya ndị be ha ugboro atọ n’Ụlọ Nzukọ ala anyị chetara ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị ọ gụrụ akwụkwọ bụ Kọleeji Onye Nsọ Vinsentị, Agbogwugwu n’ụzọ pụrụ iche ụbọchị ahụ.

N’agbanyeghị na ụlọ akwụkwọ ahụ azụpụtawo ọtụtụ ndị nwere agba na Naịjiriya mana ụfọdụ akarangwa kwesịrị ibulite ọnọdụ agụmakwụkwọ ebe ahụ adịghị.

Ụfọdụ n’ime ha gụnyere Sinetọ Ike Ekweremadu, onye bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Sinetọ Chukwuka Ụtazị, onye nnọchiteanya Mpaghara Mgbago Ugwu Enugwu Steeti na Sineti, Ọkaikpe Ịnosentị Umezurike laworo mmụọ, Onye bụbu Ichie Ọkaikpe nke Enugwu Steeti tinyekwara Okechukwu n’onwe ya.

Okechukwu gbatara ụlọ akwụkwọ ahụ zụpụtara ya ọsọ enyemaka site na ịrụ ụlọ agụmakwụkwọ ọhụrụ abụọ ma dozikwaa abụọ ọzọ.

Ya bụ mmemme jiri ụka nke Nna Ụkọchukwu Ifeanyịchukwu Jọn Okoye nke Dayọsisi Katọliki Ọ̀gwụ̀ kara were malite.

Gọvanọ Ifeanyịchukwu Ugwuanyị nke Enugwu Steeti gbaghezịrị ihe ndị ahụ Omereọha rụgasịrị ndị be ha.

Ha gụnyere ụlọ agụmakwụkwọ anọ na Kọleeji Onye Nsọ Vinsentị, Agbogwugwu, otu ụlọ agụmakwukwọ n’ụlọ akwụkwọ Central School Agbogwugwu tinyere ọdọ mmiri anọ ọ gbapụrụ n’Agbogwugwu.

N’okwu ya, Gọvanọ Ugwuanyị toro Okechukwu maka mbọ pụrụ iche ọ na-agba ịkwalite ọnọdụ obibi ndụ ndị ọ na-anọchite anya ha.

N’okwu nke ya, Hon. Saịmọn Chijioke Ude, Nnukwu Onyeisi otu jikọtara ndị Agbogwugwu nile bụ Federation of Agbogwugwu Autonomous Communities kwupụtara na nke ahụ nke atọ Rt. Hon Okechukwu na-akpọkọ ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, iji wetara otu mmepe ma ọ bụ nke ọzọ.

Okechukwu jikwa ohere ahụ were nye imerime ụmụ akwụkwọ si mpaghara ahụ  akwụkwọ ndọrọ ego iji kwụrụ ha ụgwọ ule WAEC.

Ndị ọbịa pụrụ iche bịara oge ahụ gụnyere Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyi Ugwuanyi, Nna Ụkọchukwu nke Dayọsisi Katọliki Ọ̀gwụ̀, Ụkọchukwu Dọkịnta Ifeanyịchukwu Jọn Okoye, Hon. Kọneliusu Nnaji, onye nnọchiteanya Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Enugwu /Ịsị ụzọ n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta Naịjiriya, Lọlọ Uchechukwu Okechukwu, nwunye Rt. Hon  Tobi Okechukwu tinyekwara Ichie Aleksị Chiedozie  Ogbonna, Onyeisi Ọhaneze Ndigbo  Enugwu Steeti.

Omereọha nọkwa ụbọchị ahụ were malite Atụmatụ Inye Ahụike n’efu nke o mere n’Ụlọ ọgwụ “Mother of Mercy”, Íhè nke dị n’Okpuru Ọchịchị Ọ̀gwụ̀.

Ndị ọrịa si na mpaghara ya ritere uru na ya bụ atụmatụ.

Kaosiladi, dịka ezigbo nwa-afọ Igbo, Omereọha akpaghị oké maka na ụfọdụ ndị si ebe ọzọ bụkwa ndị e leruru ahụike ha anya na ya bụ atụmatụ inye ahụike n’efu nke ga- ewe abalị iri.

.        

Otu n’ime ha bụ Oriakụ Chịka Asọgwa, onye Nsụka, onye a wara ahụ maka “fibroid”.

Leave a Reply

Your email address will not be published.