A GA-EMECHA NWEE SINETỌ UGWU AWỤSA N’ANAGHỊ ASỤNWU BEKEE CHAA CHAA -OKORỌCHA

Spread the love

Abụja – Owele Anayọ Rochas Okorọcha bụ Sinetọ na – anọchite anya Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Imo etiela mkpu na n’oge n’adịghị anya na aga enwezi ndị Sinetọ si Ugwu Awụsa n’agaghị ama asụ bekee chaa chaa. 

Okorọcha, onye bụ Gọvanọ chịburu Imo Steeti kwuru nke ka ọ na-etinye ọnụ n’okwu na Sineti Naịjiriya banyere oke itibọrịbọ na-akawanye njọ n’Ugwu Awụsa.

Okorọcha, onye ọnọdụ itibọrịbọ dị na Mpaghara Ugwu Awụsa na-emetụta n’obi kwuru na itibọrịbọ bụ oke ọrịa ji ndị Ugwu Awụsa, na e kwesịrị ilebara ya anya ọsọ ọsọ

“Itibọrịbọ nọ na Mpaghara Ugwu Awụsa karịrị akarị. Ọ dịkwa oke mkpa ka Gọọmenti mara ihe e mere banyere ya ọsọ ọsọ.

“E kwesịkwara ịrụkwu ọtụtụ ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ebe ahụ. Ma akpachaghị anya, n’ọdịnihu, ụfọdụ ndị Sinetọ ndị Ugwu Awụsa agaghị enwenwu ike ikwu okwu n’asụsụ Bekee n’ọgbakọ Sineti”

Nkea bụ Hon. Kaza, onye Omebeiwu nọ n’ụlọ nzukọ Omebeiwu nta nke Naịjiriya ebe ọ na-akpọdo asụsụ bekee n’obe na o ji bekee ekwu okwu n’ọgbakọ ụlọ nzukọ Omebeiwu iwu nta Naịjiriya.

Hon Kaza ebe ọ na-asụ asụsụ bekee akwụ 

Ndị nwoke a ka asụ bekee bụ ndị ọchịchị n’Ugwu Awụsa ka nkụ. Oge gara aga, onyonyoo nwunye Gọvanọ Nasarawa Steeti, Hajiya Silifat Sule, ebe akwụkwụ na – achọ ịdọ ya ka ọ na-agụpụta ozi e deere ya efe n’akwụkwọ, gazuru ebe nile n’ọba ozi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.