IPOB WAKPORO AMECHI NA SPEENU, KA A NA-EKWU OKWU NSOGBU ỌRAỊFITE

Spread the love

Madrid, Speenu – Ka a na-edozi nsogbu dapụtara ụbọchị Mọnde n’Ọraifite, Anambara Steeti n’etiti ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) na ndị Uwe Ojii, IPOB nọkwara ụbọchị Fraịdee wakpo Mazị Chibuike Amechi, Mịnịsta na-ahụ maka Ụgbọ Njem na Madrid, Speenu.

Mazị Ịmanụelụ Kanụ( Emma Powerful), Ọnụ na-ekwuru IPOB ekwuola hoo!haa! Mazị Chibuike Amaechi, Mịnịsta na-ahụ Ime Njem na Madrid, mba Speenu bụ site na ntụziaka Onyeisi ha bụ Mazị Nnamdị Kanụ. Emma Powerful wuru nkea ka Amechi sịrị na “ụfọdụ ndị Naịjiriya edughiere ụzọ” wakporo ya ụbọchị Fraịdee, na Speenu ka ọ bịara ọgbakọ Mgbanwe Ihu Ígwé (Climate Change).

Ọgụ ahụ dị n’etiti ndị Uwe Ojii na ndị IPOB nke riri isi opekata mpe mmadụ anọ dapụtara oge ndị Uwe Ojii gara ịkpụrụ Ifeanyị Ejiọfọ, Ọkaiwu Mazị Nnamdị Kanụ n’ụlọ ya.

Ndi Ọraifite jiri maka ọgbaghara ahụ nke butere isu ụlọ Ọkaiwu Mazị Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiọfọ na ụlọ ndị agbata obi ya ndị ọzọ ọkụ were machie otu nzuzo nakwa otu mmọnwụ dị iche iche n’obodo ahụ.

N’ozi nke Nnukwu Onyeisi ọgbakọ ndị Ọraifite bụ Ọraifite Improvement Union (OIU), Mazị Sọnị Igboanụzue, Odeakwụkwọ ha, Mazị Uche Ọfọ nakwa Isi Obi Oraifite, Igwe Daniel Udeọjị tinyere aka, ha machiri “Otu-Eke, Otu-Afor, Otu-wo, Otu-Orie, Otu Otu-Ube, Otu Ayaka nakwa udiri mmọnwụ abalị ọbụla” n’obodo ahụ.

Ihe edobeghi anya bụ etu ndị mmọnwụ ndị a si bute ọgụ n’etiti ndị Uwe Ojii na ndị IPOB.

Powerful kwuru na ha chebikwaara “ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nile aka ha dị na iri ngarị, ndị butere ndị mmadụ oke ihe isi ike”.

O kwuru na o nweghị okwu dịrị ha na Amechi iche, na mwakpo ahụ bụ maka ndị ọchịchị nile riri ego obodo.

“Anyị na-agwa ụwa nile ihe kpatara a ga-eji menye ndị a egwu maka na ha anaghị agwa ụmụ amaala obodo ha, ndị nọ n’ahụhụ eziokwu”

Chetakwa na ndị IPOB wakpokwara Sinetọ Ike Ekweremadụ, onye bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya n’ọnwa Ọgọọst na Jamani.

Kaosiladi, ọtụtụ na-ajụ ma o ziri ezi bụ mwakpo a ndị IPOB wakporo Amechi na Speenu, ebe a ka na-ekwu okwu idozi nsogbu dị n’etiti ha na ndị Uwe Ojii n’Ọraifite, Anambara Steeti.

IPOB abụ “anụ a na-agba egbe, ọ na-eri ọkpa” ka ha abụ “onye a na-awa ibi, ọ na-eto afọ” ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.