A TỤỌLA NDỊ ỌRỤ ỤLỌAKỤ KEYSTONE ABỤỌ NGA MAKA IJI AGHỤGHỌ NAPỤ MMADỤ EGO

Spread the love

Legọs – Ọkaikpe Josef nke Ụlọikpe Ukwu Legọs Steeti nọrọ taa bụ Mọnde n’Igboshere, Legọs were tụọ mmadụ abụọ so na ndị isi ụlọakụ Keystone nga afọ ise maka iji ụzọ aghụghọ were napụ mmadụ ego.

Onye ọzọ ụlọikpe ahụ makwuru ikpe bụ Mazị Ashok Israni, Onyenwe Ụlọ mmepụta ngwaahịa Nulec.

Ụlọ ọrụ EFCC nọ n’abalị asatọ nke ọnwa Ọgọọst  afọ 2012 were gbupu mmadụ atọ so n’isi n’ụlọakụ Keystone gụnyere ụlọikpe  Anayo Nwosu, Olajide Oshodi, Sunny Obazee nakwa ụlọakụ ahụ n’onwe ya tinyere Mazị Ashok Israni, Onyenwe ụlọ mmepụta ngwaahịa Nulec ya na ụlọ ọrụ ya n’ụzọ ebubo abụọ.

N’agbanyeghị na ndị ahụ a na-ebo ebubo  enweghị ọmụma ikpe nke onwe ha, ebubo e boro ha bụ na n’agbata ọnwa Juun na Julayị, afọ 2008 na ha napụrụ ego dị Narị Nde Naịra iri asatọ n’iri ise n’aka Sir Daniel Chukwudozie, Onyenwe Dozzy Oil & Gas Ltd n’ụzọ aghụghọ na ego a a na-ekwu okwu ya bụ maka ịkwụ ụgwọ oke ụlọ ọrụ Nulec.

Ụlọakụ Keystone nọkwa n’ụtụtụ a were tinye akwụkwọ ikpe mkpegharị.

Kaosiladi, ụlọakụ Keystone na-akọwa na ebubo ahụ e boro ndị ọrụ ya bụ ebubo asị nke sitere n’anya ukwu Sir Daniel Chukwudozie, Onyenwe ụlọ ọrụ Dozzy Oil & Gas Ltd.

Ha kọwara na nwoke a bụ onye nwe Dozzy Oil & Gas Ltd na Mazị Anayọ Nwosu bụ onye ọrụ ụlọakụ Keystone bụ ezigbo ọyị. Na Anayọ Nwosu na enyere enyi ya nwoke a aka ịzụta oke ụlọ ọrụ dị iche iche.

Ya mere, oge ụlọ ọrụ Nulec malitere ire oke ya, Mazị Nwosu kpọrọ Sir Daniel Chukwudozie, onye bịara zụrụ oke ebe ahụ

Kaosiladi, Sir Chukwudozie jizi aha ọtụtụ ndị ọzọ amaghị ndị ha bụ were zụọ ọtụtụ oke ụlọ ọrụ ahụ.

Ka ọnọdụ akụnụba mba ụwa bịara ghasaa n’afọ 2008, ụjọ jidere Chukwudozie na ego ya nwere ike ifu. O meziri o ji siwe iweghara ụlọ ọrụ ahụ site n’oke buru ibu o  ji n’ụlọ ọrụ ahụ.

Dika ha siri kwu, Chukwudozie zọrọ mba na ọ ga-egosi ha na ya mara ndị nọ n’ọchịchị.

Nkea meziri o ji gbaa ụlọakụ nakwa ụlọ ọrụ Nulec akwụkwọ n’Ụlọikpe na ha riri ego ya.

Ha kọwara na ego ọ na-ekwu okwu ya bụ ego o jiri zụrụ oke n’ụlọ ọrụ Nulec, na sọọsọ ihe bụ ọrụ ụlọakụ ahụ bụ irere ụlọ ọrụ Nulec oke ha, nke ha meworo ma nyefekwaa ụlọ ọrụ Nulec ego ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.