NGOSIPỤTA ỌKA OKORO ERUTEWO ENUGWU

Spread the love

Enugwu – N’abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba afọ a, aga enwe ngosipụta ejije Ọka Okoro n’ụlọ onyonyoo Diamond Cinema nke dị n’ogige Spar Shopping Mall, Enugwu n’elekere isii nke mgbede. 

Ọka Okoro bụ ejije omenala nke kọwara maka ihe dapụtara na ndụ ndị Nenwe n’oge ochie.

Kaosiladi, Lọlọ Chinelo Ụzọigwe, Onye Nlekọta Expadoc Productions bụ ndị mepụtara ejije ahụ kọwara na onye ọbụla nwere ihe ọ ga-amụta na ya bụ ejije, ma ndị Nenwe ma ndị obodo ọzọ

“N’agbanyeghị na ejije a bụ banyere ihe mere na ndụ ndị Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri nke Enugu Steeti, Ụzọigwe kọwara na a tụrụ anya na mmadụ nile ga-amụta ihe na ya.

Ọ kọwara na ejije a dị nkeji iri asatọ bụ mbụ n’ime usoro ejije ha kpọrọ” Unique Indigenous Stories Series” n’olu bekee nke bụ maka inweta ma chekwaa akụkọ mgbe ochie pụtara ìhè maka ihe megasịrị n’obodo dị iche iche.

O kwukwara na akụkọ ndị ahụ dịkwa ka e siri kọọ ha na mbụ, na ụlọ ọrụ mmepụta ejije ha bụ Expadoc na-emepụta ejije ndị a na-etinyeghi ha ihe. Sọọsọ ihe ha na-eme bụ ịkọzị ya etu ọ ga-esi masị ọtụtụ mmadụ.

“Ọ na-ewute anyị na omenala nakwa asụsụ anyị na-alazị ala. Mgbe ndị nne na nna amaghị agụgụala n’ime ala obodo ha, ọ na-abụ oke ọdachi maka na agaghị azanwu ajụjụ ụmụ ha banyere omenala ha dị iche iche ma ọ bụkwanụ nkọwa ilu ndị be ha.

Lọlọ Ụzọigwe kọwakwara na o nwere ihe iche aka mgba ha nwegasịrị dịka inweta akụkọ ziri ezi nakwa ịmata nke bụ eziokwu ma ọtụtụ ụzọ e siri kọọ otu akụkọ.

Ejije a nwekwara ndị ochie dike na Nollywood so were mee ya dịka Chiwetalu Agu, Diewait Ikpechukwu, Leo-Spider Osuji (Ududo na Nnobi) na Stan K. Amadi.

Tupu ugbua, e mebuola ngosipụta ejije a n’Abụja nakwa na Legọs. A ga-enwekwa ngosipụta ejije ahụ n’ogige Ụlọ ụka Katọliki Onye Nsọ Pita, Nenwe n’elekere isii nke mgbede n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Disemba afọ a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.