ỌRỤ AMALITEWO N’AGỤLERI UNITY CENTRE

Spread the love

Ọka – Mazị Wili Okafọ, Onye Nlekọta nke Ụlọ ọrụ, Anambra State Housing Corporation, a kpọkuola ndị obodo ndị ọzọ ka ha ṅomie otu Aguleri People’s Forum site na ịkwado ọrụ ga-eweta mmepe obodo na be ha. 

Okafọ kwuru nkea ụbọchị Satọdee n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Ọka banyere ọrụ nke ndị otu ahụ ji n’aka a kpọrọ Aguleri Unity Centre.

Okafọ, onye bụ onyeisi oche otu nhazi na-arụ ya bụ ogige kwuru na ndị Agụleri, ọ nọ n’ụlọ nakwa ọ nọ na mba bagidere ya ọrụ ahụ nke ga-efu Otu Narị nde Naịra n’iri ise ma bụrụkwa nke a na-atụ anya ịrụcha n’ime otu afọ.

O kwukwara na otu ndị  kwadoro atụmatụ ọrụ ahụ gụnyere Aguleri World Forum and Aguleri National Youth Association.

“Iwu abụghị na anyị ga-eche ka Gọọmenti rụọrọ anyị ihe nile.

“ Anyị kpebiri ịrụ ogige a nke ga-abara ma nwata, ma okenye uru ma gbanwekwaa ndụ ndị be anyị”

O kwuru na ihe e jiri tinye ogige ahụ na njegba ụzọ (junction ) Agụleri bụ maka na ebe ahụ dị n’etiti .

” Ogige ahụ ga-enwe ụlọ ezumezu na-erite mmadụ narị ise, ụlọ ịmụ ọrụ aka, ụlọ nzisa ozi bụ Information Communication Technology Centre, ụlọ erimeri, wdg.

” Site na mpaghara ndia, ndị be anyị ga-ekpori ndụ ”

Okafọ nwekwara olileanya na ogige ahụ ga-eweta udo n’ịdịnotu.

“Anyị achọghịzị agha ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ga-emebi aha obodo anyị. Ihe anyị chọrọ ugbua bụ mmepe. ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.