ABỊA ỌZỌKWA: SINETỌ TA ỌJỊ NỌ N’AKA NDỊ EFCC UGBUA

Spread the love

Abụja –  Sinetọ Tiodọ Ahamefule Ọjị, onye rịturu n’ọkwa dịka Gọvanọ Abịa Steeti ka hoo!haa!! nwetara ozi na ọ na nke ndị EFCC ugbua n’Abụja were na-azara ọnụ ya maka ebubo iri ngarị ego dị Ijeri Naịra iri abụọ n’asaa oge ọ nọ n’ọkwa dịka gọvanọ.

Sinetọ Tiodọ Ọjị, ka hoo!haa!! siri nụ bụ ya na Ọkaikpe yiri wee wuchie n’ụlọ ọrụ ndị EFCC n’ụtụtụ taa bụ Tuuzdee.

Ebubo a na-ebo ya gụnyere izupu Ijeri pụrụ Ijeri Naịra Ụlọakụ Etiti Naịjiriya nyere Abịa Steeti maka ịkwalite ndị nwere ụlọ mmepụta ngwaahịa nta nke onwe ha (Small and Medium Enterprise.)

Ego ọzọ asịkwa na nwoke a e ji Ochendo mara bubara gụnyere Ego Ọdachi (Ecological Fund), e kwesịrị ísì were rụọ ọrụ megide mbuze nakwa ọdachi ndị ọzọ na-adapụtagasị na steeti ahụ .

Ochendo, site na ebubo ahụ zupukwara ọkpụrụkpụ ego site n’ụlọ ọrụ Abia State Oil Producing Development Area Commission.

Site n’ebubo ahụ, Ọjị jiri ego ndị ahụ zụọ ọtụtụ ụlọ n’Abia, Abụja nakwa Pọt Haakọt nke EFCC na-achọzi ịkpara aka.

Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọ ọrụ EFCC, Mazị ToniOrilade azaghị oge a kpọrọ ya n’ekwentị mana o zitere ozi ekwentị were kwuo sị, “Ọ bụ eziokwu na Gọvanọ ahụ chịburu Abịa Steeti nọ na nke anyị ugbua. Mana, agaghị ekwu karịa etu a ugbua. Oge ruo ịkpụga ya ụlọikpe ndị nta akụkọ ga – ama”

Chetakwa na ụlọikpe nọ na Legọs nọrọ n’izu ụka gara aga tụọ Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ, gọvanọ nyefere Sinetọ Tiodọ Ọjị ọchịchị n’aka nga afọ iri n’abụọ maka iri ngarị dịka gọvanọ Steeti ahụ.

Ụfọdụ na-ajụzị ma ọ bụ sọọsọ ụdara mụtara nwa a na-apịwa ọnụ. Keduzi ka o si bụrụ sọọsọ ndị Abịa, Ndigbo ka EFCC na-akpụgharị.

Ndị ọzọ kwukwara na “ohi bụ ohi”. Na EFCC ịtụ ndị gọvanọ ndị Igbo zuru ohi nga ga-eme ka ndị nke nọ n’ọchịchị ugbua gbadoo anya were rụọrọ Steeti ha ọrụ etu o kwesịrị,  ghara ịna ebu ego ka “ndị nzuzu”

Hmm, EFCC, jisinu ike n’ọrụ ka ndị Gọvanọ anyị mara na ịga Ugwu Awụsa ga chie Alahaji agaghị azọpụta onye ọbụla riri ego o kwesịrị iji rụọrọ obodo ọrụ.

1 Comment

  1. Anam ekene, isi tuputalu echiche ide Akiko Igbo n’udia, biko uni adakwana-mba




    1



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.