SHARỊYA ABATA ABỤJA: TRANSCORP HILTON ANAGHỊZỊ ANABATA NWANYỊ NWOKE EDUGHI

Spread the love

Abụja – Sharịya dị ka ọ malitewo n’udi pụrụ iche n’Abụja bụ isi obodo Naịjiriya. 

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na oke ụlọ nkwari akụ e ji mara Abụja, Transcorp Hilton Abuja anaghịzị anabata nwanyị ọbụla n’enweghị nwoke du ya bịa.

Ọkammụta Chịdị Ọdịnkalụ gbara àmà n’ámáozi Twitter ya na ụlọ nkwari akụ Transcorp Hilton, Abụja ewepụtala iwu ọhụrụ nke gbochiri ndị ahịa ha ụmụ nwanyị n’enweghị nwoke du ha bịa iri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọbụla ebe ahụ.

Ọdịnkalụ, onye bụbu Onyeisi Oche, ụlọ ọrụ  National Human Rights Commission nke Naịjiriya nọrọ n’ozi ahụ o zipụrụ na Twitter kọwaa iwu ahụ dịka ‘ilachigha azụ, ịkpa oke nakwa ịda iwu’.

Hmm, ezigbo nsogbu dịkwa n’obodo a! A tụrụ anya na ezigbo ụmụ amaala Naịjiriya, ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ, ọ kacha ụmụ nwanyị nọ n’ime ha ka ha buo agha megide ajọ iwu a megidere mkpebi dị n’iwu ala Naịjiriya, na Naịjiriya enweghị okpukperechi ọ họọrọ karịa ibe ya

1 Comment

  1. This is good! But the policy should emphasize women without their husbands and not ladies without men!!! They are two different things:
    So as a lady I can go with my male friend who is not even my husband and get their attention and services, we can pay a room and pass a night there?? But if say I was sent on official duty, by my company, if I go in as a lady I will not be attended to.
    What are they trying to achieve??? What about other hotels?? They will soon notice drop in patronage and income
    They will correct themselves
    Thank you.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.