Abụja – Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) nke Ichie Edozie Njoku nọ n’isi ya ekweela nkwa ịmalite mkpezi ozigbo n’etiti ndị ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ, ma ndị pụrụ apụ ma ndị ka nọ ya, iji kwadebe maka nhọpụta ndị dị n’ihu. Njọkụ kwuru nkea n’okwu ọRead More →

Abụja – Ka Ụlọikpe Mkpedebe chụpụchara Emeka Ihedioha dịka Gọvanọ Imo Steeti n’izu ụka gara aga, a tụrụ anya na Umar Ganduje nke Kano Steeti ga-alakwa, ebe okwu ha abụọ bụ otu ihe. Kaosiladi ụlọikpe Mkpedebe Naịjiriya mekwara ihe bụzi ejirimara ha, kemgbe Ọkaikpe Tanko Yusuf ji bụrụ Ọkaikpe UkwuRead More →

Ịlọrịn –  Ọkaikpe Sikiru Oyinloye nke ụlọikpe Kwara Steeti, Ilorin atụọla otu nwoke, Abdulwahab Adebayo, nga izu ụka abụọ maka ịnọ n’Ụlọikpe were na-aza ekwentị ka ikpe na-aga n’ihu.  Abdulwahab bịara maka ikpe o nwere were jiri ekwentị ọ na-aza na-enye ụlọikpe ahụ nsogbu. Ọkaiwu ahụ kwuru na oge onyeRead More →

Legọs – Nnukwu ọkụ ọgbụgba dapụtara ụnyahụ n’okporo mmanụ ụlọ ọrụ NNPC n’Ekoro dị n’akụkụ Abule -Egba nke Legọs Steeti. Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nkụpu ndị ekperime kụpusiri okporo mmanụ ahụ iji zuru mmanụ ọkụ. Akụnụba ya bụ ọkụ tariri buru ibu manaRead More →

Abụja – Atiku Abubakar, Osote Onyeisiala n’oge gara aga ekwuola na ya kwadoro Amotekun, otu nchekwa ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ndịda. Atiku, onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’afọ 2019 kọwara na o nweghị ihe dị njọ na ya bụ atụmatụ nke ga-enye ndị ọrụ nchekwa akaRead More →

Abụja – Otu South-South Elders Forum, bụ otu ndị okenye si mpaghara Ndịda Ndịda (South South) Naịjiriya ekwuola na ndị Ugwu kwesịrị ịhapụ ha ka ha chịzuo afọ anọ ha fọrọ afọ maka na Ndị Ugwu ịnọgide n’ọkwa n’afọ 2023 ga-ebute ntisa obodo Naịjiriya. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọRead More →

Ụmụahịa –  Ihe karịrị puku mmadụ atọ nọ ngagharị iwe ugbua n’Umụahịa iji katọọ mkpebi nke ụlọikpe mkpedebe Naịjiriya jiri chụpụ Rt. Hon  Emeka Ihedioha nke PDP n’ọkwa n’ọkwa dika Gọvanọ Imo Steeti ma were tinye Sinetọ Hope Ụzọdịmma nke APC. Ndị  ngagharị iwe a gụnyere ndị ntorobịa ma ndị okenyeRead More →

Abụja – N’agbanyeghị mmachi ndị Uwe Ojii, ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP, ngalaba Imo Steeti ekwuola hoo!haa!! na ha ka ga-eme ngagharị iwe echi n’Abuja megide mkpebi Ụlọikpe Mkpede Naịjiriya nke e jiri chụpụ Emeka Ihedioha were tinye Hope Ụzọdịmma n’ọkwa dịka Gọvanọ Imo Steeti.  Ndi Uwe Ojii dịbu naRead More →

Enugwu – Onyeisi ụlọ ọrụ Dangote Group, Alahaji Aliko Dangote akpọlite ụlọ ọrụ mmepụta ụgbọala, ANAMMCO, Enugwu n’ọnwụ site na ịtụ ụgbọala ibu ‘Shacman heavy duty trucks’ n’aka ụlọ ọrụ ahụ dị n’Emene, Enugwu. Ụlọ ọrụ ANAMMCO nke ụlọ ọrụ ndị Jamani, Mercedes Benz hiwere site na nkwekọrịta ha naRead More →

Legọs –  Achịbishọọpụ Adewale Martin nke ụka Katọliki na Achịdayọsis Legọs ekwuola na uka Katọliki ga-amachi Fada Ejike Mbaka, nke ogige ekpere Adoration Enugwu ikwu okwu Chukwu ma ọ gaa n’ihu na inupu isi na nkuzi nakwa ntuziaka nke ụka Katọliki. Maatịns kwuru nke a n’okwu ọ gwara ndị ntaRead More →

Kano – Okenye ọchịchị, Alahaji Tanko Yakasai ekwupụtala ụjọ ya na site na udiri mkpebi ụlọikpe na-enyezi taa na Naịjiriya gosiri n’ezie na e jituola Ngalaba Ikpe Nkwụmọtọ n’ọchịchị nọzị ugbua. Ọ sịrị na n’agbanyeghị na ya anọghị na PDP ma ọ bụkwanụ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, na  mkpebi ụlọikpeRead More →

Vatikan – Poopu Fransis nọ na Vatikan taa were  chie Gọvanọ Wili Madụabụrọchukwu Ọbianọ echichi dịka Oke Nze ụka Katọliki (Papal Knight) . Ihe a bụ nnukwu echichi a na-echi ndị gbara mbọ pụrụ iche iji kwalite nzukọ nsọ Katọliki n’ọrụ igbasa oziọma Kristi. hoo!haa!! na-ekele  Akpọkuedike maka nnukwu ugwuRead More →

Ụkọchukwu Elijah Ejike Mbaka eduola Sinetọ Hope Ụzọdịmma n’iyi ọrụ dịka Govano Imo Steeti. Nwa Mbakọgụ bụ onye amụma Elijah anyị nwere taa na Naịjiriya n’agbanyeghị na amụma ọ na-ebuzi anaghị atọ Ndigbo ọchị chaa chaa. Onyonyoo a gosiri ebe o nyere Sinetọ Ụzọdịmma ikike o jiri napụta “agụ iheRead More →

Ọnịcha – Onye amụma na-ewu ewu, Chukwuemeka Ohanaemere, onye aha otutu ya Odumeje echeerela ndị dibịa “aka mgba mbilite n’ọnwụ” n’ama ozi Twitter. N’onyonyoo pụtara ọhụrụ, Odumeje cheere ndị dibịa nile nọ na Naịjiriya aka mgba, ma kpọkwaa ha  ndị omekome, ma kwuo na e nwere sọọsọ otu Chineke, naRead More →

Legọs – Ọkammụta Itse Sagay (SAN), Onyeisi Oche, Kọmitii ndụmọdụ Onyeisiala megide ngarị  bụ Presidential Advisory Committee Against Corruption (PACAC) agwala ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ka ha gbachite Ọkaiwu Ukwu na  Mịnịsta maka Ikpenkwụmọtọ ala anyị, Abubakar Malami (SAN) na okwu ya na otu nchekwa ndị Yoroba bụRead More →

Owere – Na ọchịchị Rt. Hon. Emeka Ihedioha dika Gọvanọ Imo Steeti abịawo na njedebe ka ọ nọchara sọọsọ ọnwa asaa abụghịzị akụkọ. Nke na-eme ugbua bụ na Osote Onyeisiala, Ọkammụta Yemi Osinbajo gbaara Rt. Hon. Emeka Ihedioha ama banyere nkata a na-akpa maka ibupu ya n’ọkwa ọchịchị. Onye NlekọtaRead More →