POOPU ‘TIRI’ NWANYỊ DỌDORO YA N’AKA IHE NA MMEMME AFỌ ỌHỤRỤ

Spread the love

Vatikan – Poopu Fransis ji iwe ‘tie’ otu nwanyị onye nkwado ya, onye dọdosiri ya ike n’aka, ka ya bụ Nna ụka na-agagharị na-ekele ndị mmadụ n’abalị Tuuzdee, tupu ọ malite Mmemme Afọ Ọhụrụ na Vatikan. 

Nwanyị ahụ dịka Onye Chaịyana, doro akara nke obe tupu Poopu erute ebe ọ nọ. Ka Poopu kwechara ya n’aka chọọ ịgafe, nwanyị ahụ seghachiri ya azụ ma dọdosie ya ike.

Nwoke mmadụ jiri iwe tie ya ihe ugboro ugboro n’aka tupu nwanyị ahụ, onye nọ na-agwa ya okwu ahapụ ya.

Nkea atọghị Poopu Fransis ọchị chaa chaa maka na ọ zọrọ onwe ya azọ n’aka nwanyị ahụ, onye mere ka “nwanyị oruru ọbara oge o zutere Jeso”.

Nwanyị ahapụghị ya ruo na ndị nchekwa ya etinye aka.

Hmm, ụta ọ dịịrị Poopu na iwe were ya? Ọ kwa mmadụ ka ọ bụ. Ọzọkwa, nwanyị chọrọ ịgụgba ya, onye ma ihe o bu n’obi

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.