E JIDELA ONYE AKA N’AKPA JI ỌGWỤ EZU

Spread the love

Legọs – Ndi Uwe Ojii na-achụ ndị oji egbe ezu, Special Anti-Robbery Squad (SARS), ngalaba Legọs Steeti ejidela Fransisi Mọnde, onye aka n’akpa ji ọgwụ ezu ndị mmadụ ohi.

Onye ohi a bụ onye Benuwe Steeti kọwara na ọ bụ onye òtù onye Afà (ụkọchukwu Alakụba) nyere ya mgba aka ọtụmọkpọ abụọ o ji akpa ike.

O kwukwara na ya na-egbu ọkụkọ (oké ọkpa) kwa abalị atọ iri rekwaa ọgwụ ahụ.

“Oge ọbụla m na-aga ‘ọrụ’, a na m eyi mgbaaka abụọ ahụ. Ebe m na-aga ọrụ bụ n’ọdụ nkwụsị ụgbọala (bus stops), ọ kacha na nke Iyana-Iba.

” Oge ọbụla m hụrụ onye ji ezigbo ego, anwụrụ ga-esi n’ahụ onye ahụ, akụkụ o tinyere ego ahụ na-apụta. Sọọsọ ihe m ga-eme bụ ịme ka ahụ m metụ onye áhụ̀. Ozigbo, ego onye ahụ ga-aba n’akpa m na-ebu aga ọrụ.

” E jikwa m ya ezunahu ndị mmadụ ọlaedo nakwa ihe ndị ọzọ ha yi n’ahụ.

” Otu ụbọchị, ezunahụrụ otu nwanyị $8,000. Ihe m zutere akarịwo Nde Naira atọ. E si m na ya jiri ihe ruru otu Nde Naira mee akwamozu  nna m na Benuwe Steeti. ”

Aka kpazịri ya n’abalị iri n’itolu nke ọnwa Disemba afọ 2019, oge o zutere onye ọgwụ ya ka nke ya.
“Ụbọchị ahụ, ka m hụrụ ka anwụrụ si nwoke ahụ n’akpa na-apụ, e chere m na m ahụla anụ oriri.
” Ka m bịazịrị imetụ ya ahụ, ọ gbọjara m were gwa m na m ka bụ nwata  n’egwu ahụ. O tiziri mkpu, ndị mmadụ gbakọọ were tie m eti eti.”
Mazị Elkana Bala, Ọnụ na-ekwuru Ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii Legọs Steeti kwuru na a ga-akpụga ya ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.

1 Comment

  1. Nkea di egwu ooo. Chineke zoba anyi n’aka ndi ekperima




    1



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.