NKỤTU MGBIDI OGIGE NDỊ NTA AKỤKỌ N’ENUGWU EKEWAALA NDỊ NTA AKỤKỌ ỤZỌ ABỤỌ

Spread the love

Enugwu – Nkụtu nke ụlọ ọrụ Enugu Capital Territory Development Authority (ECDA) kụturu mgbidi ogige ndị nta akụkọ (Press Centre), Enugwu ụbọchị Mọnde emewo ka nkewa ọchịchị dị n’otu ndị nta akụkọ, Nigeria Union of Journalists (NUJ), ngalaba Enugwu Steeti pụtazịa ìhè. 

Onyeisi oche otu a n’Enugwu Steeti, Mazị Reksị  Arụm, gwara ndị nta akụkọ na nkụtu ntụmadị ahụ n’agbanyeghị arịrịọ ndị otu ahụ ka e jiri nwayọ dozie okwu ahụ bụ ire tụkwasị obi otu a nwere n’ebe Gọọmenti Steeti ahụ nọ.

Kaosiladi, Onyeisi oche ọchịchị nchere oge NUJ na steeti ahụ,  Mazị Emeka Anyalebechi  kelere Gọọmenti steeti ahụ maka nkụtu ahụ nke ọ sị ziri ezi.

Arụm kwuru na ha na ụlọ ọrụ ECTDA ka nọ na mkparịta ụka tupu e zite ụgbọala nkwatu ụlọ ịbịa kwatu mgbidi ha

“Ịkwatu mgbidi a ka anyị ka nọ na mkparịta ụka meziri ka ogige a ghere ọnụ n’enweghị nchekwa ọbụla.

N’okwu banyere udiri mmekọrịta dị n’etiti ha na Gọọmenti steeti ahụ, Arụm kwuru sị:” O nweghị mmekọrịta dị iche n’etiti NUJ, ngalaba Steeti a na Gọọmenti steeti a. Ndị Gọvanọ kwesịrị ịbụ ndị Nna Pụrụ Iche (Grand Patron) na steeti ọbụla.

” Anyị rịọrọ Gọọmenti steeti a ugboro ugboro maka idozi ụlọ ezumezu anyị kama ihe ha meziri bụ ịkụtu mgbidi ogige a”

Arụm kọwara agwa a Gọọmenti steeti ahụ kpara dịka ‘mkparị’ nye ndị nta akụkọ.

N’aka nke ọzọ, Anyalebechi sịrị na o teela Gọọmenti steeti ahụ jiri zitere ndị otu ahụ ozi banyere nkụtu ahụ, na Gọọmenti steeti ahụ mere ihe ziri ezi.

“Anyị na-ekele Gọọmenti steeti a maka ịkata obi na mbọ ọ na-agba iweghachi Atụmatụ Ntọala Enugwu (Master plan) n’asọghị onye ọbụla anya”

Nsogbu dịkwa! Ndị nta akụkọ Enugwu Steeti, uche unu dịkwa ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.