ENUGWU: RANGERS EBUTUWO NDỊ EGWU BỌL HA MMADỤ ASATỌ N’ỌKWA MAKA AGBATAGHỊ ỌNỤ HA

Spread the love

Enugwu – Otu egwu bọl Rangers International nke Enugwu ebutuwo mmadụ asatọ n’ọkwa gaa n’otu bọl ‘B’ (ndị a na-ázụ̀ ázụ̀) maka agbataghị ọnụ ha na bọl.

Mazị Nọbaat Okolie, Ọnu na-ekwuru otu egwu bọl ahụ kwuru nkea ụbọchị Tuuzdee oge e mechara ọgbakọ ntụmadị n’ebe obibi ha n’Enugwu.

Kaọdịtaa, ndị Rangers na-agba ndị ikpeazụ n’asọmmpi nke afọ a.

O kwukwara na ha na-achọ ndị ọgba ihu (attackers) ụkwụ na-aghọ nkọ.

“Ọzọkwa, a ga na-akwụzi ndị ọgba ihu nile kwa narị iri anọ (60%) n’ụgwọ ọnwa wee ruo na ha ebido inye gol nke ọma”

N’okwu nke ya, Onye Nlekọta otu egwu bọl ahụ, Devidsịn Owumi kwuru na ọ bụ ajọ ọnọdụ egwu bọl ahụ nọ butere atụmatụ ndị a nile, iji mee ka ha bụrụ ọkaibe.

Mazị Salisu Yusuf, Osote onye nkụzi bọl ndị ‘Super Eagles’ ka a kpọtazịrị na-ekuzi ha bọl kemgbe otu ọnwa.

Bikonu, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi na ndị ọzọ ihe Rangers na-amasị gbatakwa ọsọ enyemaka tupu mmiri amaa ehi n’anya

Leave a Reply

Your email address will not be published.