MIYETTI ALLAH AMACHIELA ỊCHỊ EHI N’ABALỊ

Damaturu – Otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) nọrọ ụbọchị Wenezdee were machie ndị otu ha ịchịgharị ehi n’abalị n’ala anyị nile gbaa gburugburu iji belata ọgụ na-adịwa n’etiti ndị nchị ehi na ndi ọrụ ugbo.

Odeakwụkwọ Ukwu MACBAN, Mazị Baba Uthman gwara ndị nta akụkọ nkea ụnyahụ na Damaturu, Yobe Steeti ka e mechara ọgbakọ kwa afọ ndị otu ahụ, na mkpebi ahụ ga – abụ ntụziaka a ga-enye ndị otu ha nile, ebe onye anọna.

MACBAN machikwara ụmụaka n’etorughi etoru ịchị ehi nakwa obere ụmụaka ụmụ nwanyị ibugharị mmiri ara ehi na-ere.

Kaosiladi, Afenifere si na ha anabataghị nkea ma kpọkwaa oku ka Gọọmenti Etiti kpụpụ ndị nchi ehi ndị ogbu ọchụ ụlọikpe ka ha zara ọnụ ha maka arụ nile ha kpaworo.

N’aka nke ọzọ, ndị Arewa Consultative Forum (ACF) na  Ohanaeze Ndigbo nabatara nke ahụ.

Osote Odeakwụkwọ Mgbasa Ozi Ọhaneze Ndigbo, Mazị Chuks Ibegbu kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya. Ọ rịọkwara ndị isi otu ahụ ka ha kpụpụta ndị omekome nọ n’etiti ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.