“PASTỌ” NA-ENYEZI ỤMỤ AGBỌGHỌ ỊBA EJI ENWETA DI

Zambịya – Otu ụkọchukwu ụka akụrụmaka na Lusaka, Zambịya na-ekezi ụmụ agbọghọ ịba e sere onyonyoo ya nke ọ sịrị ga-eme ka ụmụ nwoke hụta ha were lụwa ha.

Ka egwu ka egwu, ya bụ ịba e ji enweta di na-agazị ahịa gwoo gwoo n’obodo ahụ.

N’afọ 2018, akụkọ banyere ụkọchukwu ụlọ ụka akụrụmaka nọkwa n’ihu ọgbakọ were yipu nwanyị mmadụ ịba ya wusara ụwa nile.

Ihe ụkọchukwu adigboroja ahụ kwuru bụ na nwanyị ahụ mere udiri isi n’ekwesighi ekwesị.

Hmm, o nwekwara ndị isi dị mma ka fọrọ na mba Zambịya mere udiri akụkọ nzuzu a nile ji bụrụ ihe si n’obodo ahụ apụta oge nile.

Ụmụ agbọghọ achọghịkwa inyere onwe ha aka. Chai!

Leave a Reply

Your email address will not be published.