AMOTEKUN: AFENIFERE NA OPC NA-ADỤ ONWE HA AKA N’ỌNỤ

Spread the love

Aka anyị adịghị ya – Afenifere

Onye ọbụla n’achọghị Amotekun bụ onye iro ndị Yoroba – OPC

Ibadan – Otu Afenifere, ekwuwo hoo!haa! na aka ha adịghị na Amotekun, otu nchekwa ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ndịda hiwere ụnyahụ n’Ibadan, Ọyọ Steeti. 

Ichie Yinka Odumakin, ọnụ na-ekwuru Afenifere, n’okwu ya ụbọchị Wenezdee na ‘Sunrise Daily’, mmemme ụtụtụ Channels TV, kọwara na aka Afenifere adịghị na Amotekun.

Odumakin kwuru sị: “Amotekun abụghị ọgwụ ya, sọọsọ Uwe Ojii Steeti”

Odumakin gakwara n’ihu kwuo na Nghazigharị Usoro Ọchịchị bụ ihe agaghị agbatanwu n’ọsọ

“O nweghị ụzọ a ga-esi pụta n’ọnọdụ a n’abụghị Nghazigharị Usoro Ọchịchị na Uwe Ojii Steeti”

Ọ gbarụkwara ihu banyere ozi e wepụtaburu afọ gara aga maka OPC na Miyetti Allah ịrụkọ ọrụ ọnụ

“Kedu ka ha siri kpebie maka OPC na Miyetti Allah ịrụkọ ọrụ ọnụ? Miyetti Allah bụ ya bụ nsogbu. Ọ dị ka mmadụ na onye ohi ịrụkọ ọrụ ọnụ”

Kaosiladi, Aare Onakakanfo nke ala Yoruba ma bụrụkwa Onye Nlekọta OPC, Iba Gani Adams, kwuru na Amotekun bụ ihe magburu onwe ya, bụrụkwa ihe oge ya ruru.

Adams kwukwara na onye ọbụla n’akwadoghi Amotekun bụ onye iro ndị Yoroba.

”A na m ekwu hoo!haa! na obi dị ndị Yoroba ụtọ maka atụmatụ a. Onye ọbụla na-akatọ Amotekun bụ onye arụrụala ma ọ bụ onye a zụghị azụ”

Ọ kwukwara na Amotekun abụghị Uwe Ojii Steeti kama na ọ bụ atụmatụ nchere oge

Leave a Reply

Your email address will not be published.